The Bible › Baịbụlụ Nsọ › Numbers 11
Joshua nwa Nun, onyeozi Mosis site na mgbe ọ bụ okorobịa, gwara Mosis okwu sị ya, “Onyenwe m Mosis, mee ka ndị a kwụsị ibu amụma.”
Numbers 11:28 · Baịbụlụ Nsọ
← PreviousRead Numbers 11Next →
And Joshua the son of Nun, the servant of Moses, one of his young men, answered and said, My lord Moses, forbid them.
Joshua son of Nun, the attendant to Moses since youth, spoke up and said, “Moses, my lord, stop them!”
Joshua the son of Nun, the servant of Moses, one of his chosen men, answered, “My lord Moses, forbid them!”
Every translation above is public domain and free to share. Other versions — NIV · ESV · NKJV · NLT · NASB · CSB · AMP — are copyrighted and open on their publishers’ partner site.
25 Mgbe ahụ, Onyenwe anyị rịdatara nʼime igwe ojii. Ya na Mosis kparịtaa ụka. Onyenwe anyị weere ụfọdụ nʼime Mmụọ dị nʼime Mosis, tinye ya nʼime iri ndị okenye asaa ndị ahụ. Mgbe Mmụọ a batara nʼime ha, ha niile buru amụma. Ma ha ebughị amụma gaa nʼihu.
26 Ma mmadụ abụọ nʼime iri ndị okenye asaa ndị ahụ, Eldad na Medad nọgidere nʼọmụma ụlọ ikwu ha. Ọ bụ ezie na e depụtara aha ha dịka ndị ndu, ma ha esoghị ndị ọzọ gaa nʼụlọ nzute. Ma Mmụọ ahụ bịakwasịrị ha nʼebe ahụ ha nọ. Ha bukwara amụma.
27 Otu okorobịa gbapụrụ ọsọ gaa kọọrọ Mosis sị ya, “Eldad na Medad na-ebu amụma nʼọmụma ụlọ ikwu ha.”
28 Joshua nwa Nun, onyeozi Mosis site na mgbe ọ bụ okorobịa, gwara Mosis okwu sị ya, “Onyenwe m Mosis, mee ka ndị a kwụsị ibu amụma.”
29 Ma Mosis zara sị, “Ọ bụ nʼihi ikwochitara m ekworo ka i ji chọọ ka m kwụsị ha? Ọ gaara atọ m ụtọ ma a sị na ndị Onyenwe anyị niile bụ ndị amụma, ndị Onyenwe anyị ga-etinye Mmụọ ya nʼime ha!”
30 Mgbe ahụ Mosis na ndị okenye Izrel ndị ahụ niile lọghachiri nʼebe ụlọ ikwu ha dị.
31 Otu oke ifufe sitere nʼebe Onyenwe anyị nọ bịa si nʼosimiri bute ọtụtụ nnụnụ a na-akpọ kweel. O mere ka nnụnụ ndị a daa nʼebe ụmụ Izrel mara ụlọ ikwu ha, nʼime ogige ya niile. Nnụnụ ndị a fere ihe dịka otu mita site nʼelu ala, nʼakụkụ niile, ruo nʼebe mmadụ pụrụ iji ụkwụ jeruo nʼotu ụbọchị. Ha jupụtakwara ebe niile.
Read Numbers 11 in the app The whole chapter