The Bible › Baịbụlụ Nsọ › Numbers 11

Numbers 11:20

Kama unu ga-eri ya otu ọnwa zuru ezu, ruo mgbe ọ ga-esi unu nʼimi sọpụta, ghọrọ unu ihe ịsọ oyi. Nʼihi na unu ajụla Onyenwe anyị, onye nọ nʼetiti unu, kwaa akwa nʼihu ya, sị, “Gịnị mere anyị ji site nʼala Ijipt pụta?” ’ ”

Numbers 11:20 · Baịbụlụ Nsọ

← PreviousRead Numbers 11Next →

Numbers 11:20 in other translations

KJV King James Version

But even a whole month, until it come out at your nostrils, and it be loathsome unto you: because that ye have despised the LORD which is among you, and have wept before him, saying, Why came we forth out of Egypt?

BSB Berean Standard Bible

but for a whole month—until it comes out of your nostrils and makes you nauseous—because you have rejected the LORD, who is among you, and have cried out before Him, saying, ‘Why did we ever leave Egypt?’”

WEB World English Bible

but a whole month, until it comes out at your nostrils, and it is loathsome to you; because you have rejected the LORD who is among you, and have wept before him, saying, “Why did we come out of Egypt?”’”

Every translation above is public domain and free to share. Other versions — NIV · ESV · NKJV · NLT · NASB · CSB · AMP — are copyrighted and open on their publishers’ partner site.

In context

17 Aga m abịa nʼebe ahụ gwa gị okwu. Mgbe ahụ kwa, aga m ewere ụfọdụ nʼime Mmụọ m dị nʼime gị tinye nʼime iri ndị ndu asaa ahụ. Ha ga-enyere gị aka ibu ibu arọ nke ịchịkọta ụmụ Izrel. Nʼụzọ dị otu a, ọ gaghị abụkwa ibu dịrị naanị gị ibu.

18 “Ugbu a, gwa ndị Izrel niile si ha, ‘Doonụ onwe unu nsọ, kwadoonụ maka echi, mgbe unu ga-ata anụ. Onyenwe anyị nụrụ mgbe unu kwara akwa sị, “A sịkwa na anyị nwere anụ anyị ga-ata. Ihe dịrị anyị mma nʼIjipt karịa otu ọ dị ugbu a.”

19 Anụ unu ga-eri abụghị naanị nke otu ụbọchị, maọbụ ụbọchị abụọ, maọbụ ụbọchị ise, maọbụ iri, ma ọ bụkwanụ iri ụbọchị abụọ!

20 Kama unu ga-eri ya otu ọnwa zuru ezu, ruo mgbe ọ ga-esi unu nʼimi sọpụta, ghọrọ unu ihe ịsọ oyi. Nʼihi na unu ajụla Onyenwe anyị, onye nọ nʼetiti unu, kwaa akwa nʼihu ya, sị, “Gịnị mere anyị ji site nʼala Ijipt pụta?” ’ ”

21 Ma Mosis sịrị Onyenwe anyị, “Ọnụọgụgụ ndị ikom dị narị puku isii ndị ji ụkwụ eje ka m nọ nʼetiti ha, ma ị na-asị, ‘Aga m enye ha anụ otu ọnwa.’

22 Ọ ga-ezuru ha ma ọ bụrụ na e gbuoro ha igwe ehi na atụrụ? Ọ bụ azụ niile nke dị nʼoke osimiri ga-ezuru ha ma egbuo ha niile nye ha?”

23 Onyenwe anyị sịrị Mosis, “Aka Onyenwe anyị ọ dị mkpụmkpụ? Ugbu a, ị ga-ahụ ma m ga-emezu okwu m, maọbụ na m agaghị emezu ya.”

Read Numbers 11 in the app The whole chapter

Search the Scriptures

Choose a translation

KJVBSBWEBNHEBASVYLTDBYWBTBBEEBRGNVDRALUTCANRIVLSGRVABPMYORIGBSWATGLIRV