The Bible › Baịbụlụ Nsọ › Numbers 11

Numbers 11:13

Ebee ka m ga-achọta anụ ga-ezuru igwe mmadụ ndị a? Lee na ha na-akwasa m akwa na-asị m, ‘Nye anyị anụ!’

Numbers 11:13 · Baịbụlụ Nsọ

← PreviousRead Numbers 11Next →

Numbers 11:13 in other translations

KJV King James Version

Whence should I have flesh to give unto all this people? for they weep unto me, saying, Give us flesh, that we may eat.

BSB Berean Standard Bible

Where can I get meat for all these people? For they keep crying out to me, ‘Give us meat to eat!’

WEB World English Bible

Where could I get meat to give all these people? For they weep before me, saying, ‘Give us meat, that we may eat.’

Every translation above is public domain and free to share. Other versions — NIV · ESV · NKJV · NLT · NASB · CSB · AMP — are copyrighted and open on their publishers’ partner site.

In context

10 Mosis nụrụ mkpu akwa ụmụ Izrel niile, nke na-ada nʼezinaụlọ ọbụla nʼakụkụ ọnụ ụzọ ụlọ ikwu ha. Iwe were Onyenwe anyị nke ukwuu. Otu a kwa, obi jọrọ Mosis njọ nke ukwuu.

11 Mosis jụrụ Onyenwe anyị sị, “Gịnị mere i ji bokwasị ohu gị nsogbu dị otu a nʼisi? Gịnị ka m mere na m ahụtakwaghị amara nʼebe ị nọ, nke mere i ji bukwasị m ibu arọ nke ilekọta ndị a?

12 Ọ bụ m tụrụ ime ndị a niile? Ọ bụ m mụrụ ha? Gịnị mere i ji si m kuru ha nʼaka m gawa nʼala ahụ ị ṅụrụ nʼiyi inye nna nna ha, dịka m bụ nne nwa na-ekugharị nwantakịrị?

13 Ebee ka m ga-achọta anụ ga-ezuru igwe mmadụ ndị a? Lee na ha na-akwasa m akwa na-asị m, ‘Nye anyị anụ!’

14 Agaghị m ebulite ibu ịchịkọta ndị a niile nʼonwe m! Ibu a dị m arọ nke ukwuu.

15 Ọ bụrụ na ị ga-esi otu a meso m mmeso, biko napụ m ndụ m ugbu a, nʼihi na ọnwụ m ga-egosi na m natara amara nʼebe ị nọ. Site nʼọnọdụ a ga-ewetara m mbibi wezuga m.”

16 Mgbe ahụ, Onyenwe anyị gwara Mosis okwu sị ya, “Kpọkọta iri ndị okenye ụmụ Izrel asaa, ndị ị maara na ha bụ ndị ndu, na ndị nlekọta ije ozi nʼetiti ụmụ Izrel. Kpọta ha nʼụlọ nzute m ka ha soro gị guzoro.

Read Numbers 11 in the app The whole chapter

Search the Scriptures

Choose a translation

KJVBSBWEBNHEBASVYLTDBYWBTBBEEBRGNVDRALUTCANRIVLSGRVABPMYORIGBSWATGLIRV