The Bible › Baịbụlụ Nsọ › Numbers 11
Mgbe na-adịghị anya ụmụ Izrel bidoro itamu ntamu nʼihi ihe ike niile ha na-ezute nʼije ha. Ma ntamu a ruru Onyenwe anyị ntị. Nʼihi ya, Onyenwe anyị were iwe dị ukwuu megide ha. Ọkụ sitere nʼebe Onyenwe anyị nọ, ree nʼetiti ha, repịa ụfọdụ ndị bi nʼakụkụ ngwụsị ọmụma ụlọ ikwu ahụ.
Numbers 11:1 · Baịbụlụ Nsọ
← PreviousRead Numbers 11Next →
And when the people complained, it displeased the LORD: and the LORD heard it; and his anger was kindled; and the fire of the LORD burnt among them, and consumed them that were in the uttermost parts of the camp.
Soon the people began to complain about their hardship in the hearing of the LORD, and when He heard them, His anger was kindled, and fire from the LORD blazed among them and consumed the outskirts of the camp.
The people were complaining in the ears of the LORD. When the LORD heard it, his anger burned; and the LORD’s fire burned among them, and consumed some of the outskirts of the camp.
Every translation above is public domain and free to share. Other versions — NIV · ESV · NKJV · NLT · NASB · CSB · AMP — are copyrighted and open on their publishers’ partner site.
1 Mgbe na-adịghị anya ụmụ Izrel bidoro itamu ntamu nʼihi ihe ike niile ha na-ezute nʼije ha. Ma ntamu a ruru Onyenwe anyị ntị. Nʼihi ya, Onyenwe anyị were iwe dị ukwuu megide ha. Ọkụ sitere nʼebe Onyenwe anyị nọ, ree nʼetiti ha, repịa ụfọdụ ndị bi nʼakụkụ ngwụsị ọmụma ụlọ ikwu ahụ.
2 Mgbe nke a mere, ụmụ Izrel tikuru Mosis mkpu akwa. Mosis kpere ekpere nye Onyenwe anyị nʼihi ha, ọkụ ahụ kwụsịkwara.
3 Nʼihi ya, a kpọrọ ebe ahụ Tabera, nʼihi ọkụ ahụ si nʼebe Onyenwe anyị nọ ree nʼetiti ha.
4 Ndị amakekwu so ụmụ Izrel nʼije a malitere itamu ntamu banyere nri ndị ọzọ na-agụ ha agụụ. Nke a mere ka ụmụ Izrel malite ịkwa akwa, na-asị, “A sịkwarị na anyị nwere anụ anyị ga-ata.
Read Numbers 11 in the app The whole chapter