The Bible › Baịbụlụ Nsọ › Numbers 10
Mosis gwara Hobab nwa Reuel, nna nwunye ya onye Midia okwu sị, “Anyị ebiliela ije ịga ebe ahụ Onyenwe anyị gwara anyị sị, ‘Aga m enye unu.’ Bịa ka ị soro anyị. Anyị ga-emezi gị nke ọma nʼihi na Onyenwe anyị ekwela Izrel nkwa ọtụtụ ezi ihe.”
Numbers 10:29 · Baịbụlụ Nsọ
← PreviousRead Numbers 10Next →
And Moses said unto Hobab, the son of Raguel the Midianite, Moses' father in law, We are journeying unto the place of which the LORD said, I will give it you: come thou with us, and we will do thee good: for the LORD hath spoken good concerning Israel.
Then Moses said to Hobab, the son of Moses’ father-in-law Reuel the Midianite, “We are setting out for the place of which the LORD said: ‘I will give it to you.’ Come with us, and we will treat you well, for the LORD has promised good things to Israel.”
Moses said to Hobab, the son of Reuel the Midianite, Moses’ father-in-law, “We are journeying to the place of which the LORD said, ‘I will give it to you.’ Come with us, and we will treat you well; for the LORD has spoken good concerning Israel.”
Every translation above is public domain and free to share. Other versions — NIV · ESV · NKJV · NLT · NASB · CSB · AMP — are copyrighted and open on their publishers’ partner site.
26 Pagịel nwa Okran bụ onyendu usuu ebo Asha.
27 Ahira nwa Enan bụ onyendu usuu ebo Naftalị.
28 Nke a bụ usoro usuu ụmụ Izrel si bilie ije ha.
29 Mosis gwara Hobab nwa Reuel, nna nwunye ya onye Midia okwu sị, “Anyị ebiliela ije ịga ebe ahụ Onyenwe anyị gwara anyị sị, ‘Aga m enye unu.’ Bịa ka ị soro anyị. Anyị ga-emezi gị nke ọma nʼihi na Onyenwe anyị ekwela Izrel nkwa ọtụtụ ezi ihe.”
30 Ma ọ zara sị, “E e, agaghị m eso unu. Ana m alaghachi nʼala nke aka m ịlaghachikwuru ụmụnna m.”
31 Ma Mosis zara sị ya, “Biko ahapụla anyị nʼihi na ị maara ebe anyị nwere ike kwụsị zuo ike nʼọzara. Ị ga-abụrụ anyị anya anyị ji ahụ ụzọ.
32 Ọ bụrụ na i soro anyị, anyị ga-ekenye gị ihe ọma ọbụla Onyenwe anyị ga-enye anyị.”
Read Numbers 10 in the app The whole chapter