The Bible › Baịbụlụ Nsọ › Numbers 10
Usuu ọmụma ụlọ ikwu nke ebo Juda buru ụzọ bulie ije a, nʼokpuru ọkọlọtọ ha. Nashọn, nwa Aminadab, bụ onyendu ha.
Numbers 10:14 · Baịbụlụ Nsọ
← PreviousRead Numbers 10Next →
In the first place went the standard of the camp of the children of Judah according to their armies: and over his host was Nahshon the son of Amminadab.
First, the divisions of the camp of Judah set out under their standard, with Nahshon son of Amminadab in command.
First, the standard of the camp of the children of Judah went forward according to their armies. Nahshon the son of Amminadab was over his army.
Every translation above is public domain and free to share. Other versions — NIV · ESV · NKJV · NLT · NASB · CSB · AMP — are copyrighted and open on their publishers’ partner site.
11 Nʼụbọchị iri abụọ, nʼime ọnwa nke abụọ, nʼafọ nke abụọ, igwe ojii ahụ biliri site nʼelu ụlọ nzute nke igbe iwu ọgbụgba ndụ ahụ.
12 Mgbe ahụ, ụmụ Izrel biliri ije site nʼọzara Saịnaị jegharịa site nʼotu ebe ruo nʼebe ọzọ tutu igwe ojii ahụ akwụsị nʼọzara Paran.
13 Nke a bụ njem mbụ ha mere dịka Onyenwe anyị si nye Mosis iwu banyere ije ha.
14 Usuu ọmụma ụlọ ikwu nke ebo Juda buru ụzọ bulie ije a, nʼokpuru ọkọlọtọ ha. Nashọn, nwa Aminadab, bụ onyendu ha.
15 Netanel nwa Zua bụ onyendu usuu ebo Isaka.
16 Eliab nwa Helọn bụ onyendu usuu ebo Zebụlọn
17 Mgbe ahụ, e wedara ụlọ nzute ahụ. Ụmụ Geshọn na Merari buru ya, bilikwaa ije ha.
Read Numbers 10 in the app The whole chapter