The Bible › Baịbụlụ Nsọ › Numbers 1
“Gaa gụọ ma chọpụta ọnụọgụgụ ndị ikom niile e nwere nʼetiti ọgbakọ Izrel, dịka ebo ha na agbụrụ ha si dị, na dịka ezinaụlọ ha si dịkwa. Depụta aha nwoke ọbụla nʼotu na otu.
Numbers 1:2 · Baịbụlụ Nsọ
← PreviousRead Numbers 1Next →
Take ye the sum of all the congregation of the children of Israel, after their families, by the house of their fathers, with the number of their names, every male by their polls;
“Take a census of the whole congregation of Israel by their clans and families, listing every man by name, one by one.
“Take a census of all the congregation of the children of Israel, by their families, by their fathers’ houses, according to the number of the names, every male, one by one,
Every translation above is public domain and free to share. Other versions — NIV · ESV · NKJV · NLT · NASB · CSB · AMP — are copyrighted and open on their publishers’ partner site.
1 Onyenwe anyị gwara Mosis okwu nʼọzara Saịnaị, nʼime ụlọ nzute, nʼụbọchị nke mbụ, nʼọnwa nke abụọ nke afọ abụọ, mgbe ụmụ Izrel pụtachara site nʼobodo Ijipt. Ọ sịrị,
2 “Gaa gụọ ma chọpụta ọnụọgụgụ ndị ikom niile e nwere nʼetiti ọgbakọ Izrel, dịka ebo ha na agbụrụ ha si dị, na dịka ezinaụlọ ha si dịkwa. Depụta aha nwoke ọbụla nʼotu na otu.
3 Gị na Erọn ga-agụkọta ndị ikom Izrel niile gbara iri afọ abụọ maọbụ karịa ọnụ, bụ ndị tozuru ije agha. Unu ga-edo ha nʼusuu, nʼusuu.
4 Otu nwoke, site nʼebo Izrel ọbụla, onye bụ onyendu ezinaụlọ, ga-esonyere unu nʼọrụ a.
5 “Ndị a bụ aha ndị ikom ndị ahụ ga-enyere unu aka. “Site nʼebo Ruben, Elizọ na Shedeua,
Read Numbers 1 in the app The whole chapter