The Bible › Baịbụlụ Nsọ › Numbers 1
Mosis na Erọn nabatara ndị ikom ndị a, bụ ndị e depụtara aha ha.
Numbers 1:17 · Baịbụlụ Nsọ
← PreviousRead Numbers 1Next →
And Moses and Aaron took these men which are expressed by their names:
So Moses and Aaron took these men who had been designated by name,
Moses and Aaron took these men who are mentioned by name.
Every translation above is public domain and free to share. Other versions — NIV · ESV · NKJV · NLT · NASB · CSB · AMP — are copyrighted and open on their publishers’ partner site.
14 site nʼebo Gad, Eliasaf nwa Deuel
15 site nʼebo Naftalị, Ahira nwa Enan.”
16 Ndị a bụ ndị ikom e si nʼọgbakọ ahụ họpụta, ndị bụ ndị ndu ebo dị iche iche nʼIzrel. Ha bụ ndị ndu ebo niile dị nʼIzrel.
17 Mosis na Erọn nabatara ndị ikom ndị a, bụ ndị e depụtara aha ha.
18 Emesịa, ha kpọrọ nzukọ ndị Izrel niile ka ha zukọọ nʼụbọchị mbụ nke ọnwa abụọ. Ndị niile zukọrọ kọwara ikwu ha na ezinaụlọ ha si pụta nʼotu na otu. Ma ndị ikom niile gbara site nʼiri afọ abụọ gbagoo ka e denyere aha ha nʼakwụkwọ nʼotu na otu,
19 dịka Onyenwe anyị si nye Mosis nʼiwu. Otu a kwa ka Mosis si gụọ ha ọnụ nʼọzara Saịnaị.
20 Ụmụ Ruben, bụ ọkpara Izrel: Ndị ikom niile gbara iri afọ abụọ gbagoo; ndị tozuru ije agha ka e dere aha ha nʼusoro nʼotu nʼotu dịka ikwu ha na ezinaụlọ ha si dị.
Read Numbers 1 in the app The whole chapter