The Bible › Baịbụlụ Nsọ › Nehemiah 6
E goro ya ọrụ ka o yinye m egwu, ka m site na-ime otu a mehie, mgbe ahụ, ha ga-ahụ ihe ha ga-eji nye m aha ọjọọ, kwaa m emo.
Nehemiah 6:13 · Baịbụlụ Nsọ
← PreviousRead Nehemiah 6Next →
Therefore was he hired, that I should be afraid, and do so, and sin, and that they might have matter for an evil report, that they might reproach me.
He had been hired to intimidate me so that I would sin by doing as he suggested, so they could give me a bad name in order to discredit me.
He was hired so that I would be afraid, do so, and sin, and that they might have material for an evil report, that they might reproach me.
Every translation above is public domain and free to share. Other versions — NIV · ESV · NKJV · NLT · NASB · CSB · AMP — are copyrighted and open on their publishers’ partner site.
10 Otu ụbọchị, a gara m nʼụlọ Shemaya, nwa Delaya, nwa Mehetabel, onye e mechibidoro ụzọ nʼụlọ ya. Ọ sịrị m, “Ka anyị zukọta nʼụlọ Chineke, nʼime ụlọnsọ, ka anyị mechiekwa ụzọ niile nke ụlọnsọ ahụ, nʼihi na ndị ikom na-abịa igbu gị, e, nʼabalị ka ha na-abịa igbu gị.”
11 Ma azara m si; “O kwesiri ka mụ onwe m bụ onyeisi ọchịchị gbaa ọsọ? O kwesiri ka mmadụ dịka m gbaa ọsọ gbaba nʼụlọnsọ Chineke ịzọpụta ndụ ya? Agaghị m aga.”
12 Mgbe ahụ ka o doro m anya na Chineke agwaghị ya okwu ọbụla, kama na ọ bụ Tobaya na Sanbalat zụrụ ya.
13 E goro ya ọrụ ka o yinye m egwu, ka m site na-ime otu a mehie, mgbe ahụ, ha ga-ahụ ihe ha ga-eji nye m aha ọjọọ, kwaa m emo.
14 “Chineke m, cheta Tobaya na Sanbalat, nʼihi ihe ndị a niile ha mere, chetakwa Noadaya, bụ onye amụma nwanyị, na ndị amụma ndị ọzọ niile fọdụrụ, bụ ndị ahụ chọrọ ime ka m tụọ egwu.”
15 E wuchara mgbidi ahụ nʼụbọchị iri abụọ na ise nke ọnwa Elul, nʼime iri ụbọchị ise na abụọ.
16 Mgbe ndị iro anyị niile nụrụ ya, mba niile ndị nọ anyị gburugburu tụrụ ụjọ, obi jụkwara ha oyi, nʼihi na ha matara na-arụrụ ọrụ a site nʼinyeaka Chineke.
Read Nehemiah 6 in the app The whole chapter