The Bible › Baịbụlụ Nsọ › Nehemiah 13
o weere otu ọnụụlọ buru ibu a na-achịkọba ihe nye ya. Na mbụ, ọ bụ ọnụụlọ ebe a na-achịkọta onyinye ọka na ụda na-esi isi ụtọ, na ngwongwo ụlọnsọ, na efere mmanya ọhụrụ, na mmanụ oliv. Mosis enyelarị ya nʼiwu na ọ bụ ndị Livayị na ndị ọbụ abụ na ndị nche nwe onyinye ndị ahụ. Ndị nchụaja nwekwa oke nʼihe ndị a.
Nehemiah 13:5 · Baịbụlụ Nsọ
← PreviousRead Nehemiah 13Next →
And he had prepared for him a great chamber, where aforetime they laid the meat offerings, the frankincense, and the vessels, and the tithes of the corn, the new wine, and the oil, which was commanded to be given to the Levites, and the singers, and the porters; and the offerings of the priests.
and had prepared for Tobiah a large room where they had previously stored the grain offerings, the frankincense, the temple articles, and the tithes of grain, new wine, and oil prescribed for the Levites, singers, and gatekeepers, along with the contributions for the priests.
had prepared for him a great room, where before they laid the meal offerings, the frankincense, the vessels, and the tithes of the grain, the new wine, and the oil, which were given by commandment to the Levites, the singers, and the gatekeepers; and the wave offerings for the priests.
Every translation above is public domain and free to share. Other versions — NIV · ESV · NKJV · NLT · NASB · CSB · AMP — are copyrighted and open on their publishers’ partner site.
2 Nʼihi na ha bụ ndị iro ụmụ Izrel. Ha enyeghị ha ihe oriri na ihe ọṅụṅụ kama ha zụrụ Belam ka ọ bụọ ụmụ Izrel ọnụ. (Ma Chineke anyị gbanwere ịbụ ọnụ ahụ mee ka ọ ghọọ ngọzị.)
3 Mgbe a gụpụtara iwu a, ndị Izrel chụpụrụ ndị mba ọzọ niile nọ nʼọgbakọ ha.
4 Ma tupu ihe ndị a niile emee, Eliashib onye bụ onye nchụaja, onye e doro nʼisi ilekọta ime ụlọ a na-achịkọba ihe nʼụlọ Chineke anyị, ya na Tobaya nwee ezi mmekọrịta,
5 o weere otu ọnụụlọ buru ibu a na-achịkọba ihe nye ya. Na mbụ, ọ bụ ọnụụlọ ebe a na-achịkọta onyinye ọka na ụda na-esi isi ụtọ, na ngwongwo ụlọnsọ, na efere mmanya ọhụrụ, na mmanụ oliv. Mosis enyelarị ya nʼiwu na ọ bụ ndị Livayị na ndị ọbụ abụ na ndị nche nwe onyinye ndị ahụ. Ndị nchụaja nwekwa oke nʼihe ndị a.
6 Mgbe ihe ndị a na-eme, anọghị m na Jerusalem, nʼihi na nʼiri afọ atọ na abụọ nke ọchịchị Ataksekses, eze Babilọn, a lọghachikwutere m eze. Ma e mesịrị m nata ya ike
7 laghachikwa na Jerusalem. Nʼebe a ka m nọ mata banyere ihe ọjọọ ahụ Eliashib mere, inye Tobaya otu ọnụụlọ nke dị nʼogige ụlọ Chineke ka ọ bụrụ ebe izuike ya.
8 Iwe were m nke ukwuu, nke mere na m sitere nʼọnụụlọ ahụ tụpụsịa ngwongwo Tobaya niile nʼezi.
Read Nehemiah 13 in the app The whole chapter