The Bible › Baịbụlụ Nsọ › Nehemiah 13
Ma a dọrọ ha aka na ntị, sị, “Gịnị ka unu ji na-anọ ọnọdụ abalị nʼakụkụ mgbidi a? Ọ bụrụ na unu eme ya ọzọ, aga m enye iwu ka e jide unu.” Site nʼụbọchị ahụ gaa nʼihu, ha abịakwaghị ọzọ nʼụbọchị izuike.
Nehemiah 13:21 · Baịbụlụ Nsọ
← PreviousRead Nehemiah 13Next →
Then I testified against them, and said unto them, Why lodge ye about the wall? if ye do so again, I will lay hands on you. From that time forth came they no more on the sabbath.
but I warned them, “Why are you camping in front of the wall? If you do it again, I will lay hands on you.” From that time on, they did not return on the Sabbath.
Then I testified against them, and said to them, “Why do you stay around the wall? If you do so again, I will lay hands on you.” From that time on, they didn’t come on the Sabbath.
Every translation above is public domain and free to share. Other versions — NIV · ESV · NKJV · NLT · NASB · CSB · AMP — are copyrighted and open on their publishers’ partner site.
18 Ọ bụghị otu ihe a ka nna nna unu ha mere, nke mere na Chineke wetara ọdachi a tụkwasị anyị nakwa obodo a? Ugbu a, unu na-akpali ọnụma tụkwasị na nke dị megide Izrel site nʼimerụ ụbọchị izuike?”
19 Nʼihi nke a, enyere m iwu na a ga-emechi ọnụ ụzọ ama Jerusalem nʼuhuruchi tupu ụbọchị izuike, ruo mgbe ụbọchị izuike gafesịrị. Emere m ka ụfọdụ ndị ohu m na-anọ na nche nʼebe ahụ, ịhụ na ọ dịghị onye ahịa ọbụla ga-abata nʼime obodo Jerusalem nʼụbọchị izuike.
20 Ya mere, ndị na-azụ ahịa na ndị na-ere ụdị ngwa ahịa dị iche iche, na-anọ ọnọdụ abalị nʼazụ Jerusalem, otu gboro maọbụ ugboro abụọ.
21 Ma a dọrọ ha aka na ntị, sị, “Gịnị ka unu ji na-anọ ọnọdụ abalị nʼakụkụ mgbidi a? Ọ bụrụ na unu eme ya ọzọ, aga m enye iwu ka e jide unu.” Site nʼụbọchị ahụ gaa nʼihu, ha abịakwaghị ọzọ nʼụbọchị izuike.
22 Mgbe ahụ, enyere m ndị Livayị iwu ka ha doo onwe ha ọcha, nọọkwa na nche nʼọnụ ụzọ ama, ịhụ na onye ọbụla doro ụbọchị izuike nsọ. Chineke m, biko, cheta m nʼihi ihe ọma ndị a niile, nwee amara nʼebe m nọ, dịka ịba ụba nke obi ebere gị si dị.
23 Ọzọ, nʼụbọchị ndị ahụ a hụrụ m ndị ikom Juda ndị lụtara ndị inyom site nʼetiti ndị Ashdọd, na ndị Amọn, na ndị Moab,
24 chọpụtakwa na ọkara nʼetiti ụmụ ha na-asụ naanị asụsụ ndị Ashdọd, maọbụ otu asụsụ nke ndị mba ọzọ, ma ha amaghị asụsụ Juda ma ọlị.
Read Nehemiah 13 in the app The whole chapter