The Bible › Baịbụlụ Nsọ › Micah 5
Ndị fọdụrụ afọdụ nke Jekọb ga-adịkwa nʼetiti ọtụtụ ndị mmadụ dị ka ọdụm nʼetiti anụ ọhịa niile dị iche iche, e, dịka nwa ọdụm nʼetiti igwe atụrụ, nke na-azọda na-adọkasị mgbe ọ na-agabiga, ma o nweghị onye ga-anapụta ya.
Micah 5:8 · Baịbụlụ Nsọ
And the remnant of Jacob shall be among the Gentiles in the midst of many people as a lion among the beasts of the forest, as a young lion among the flocks of sheep: who, if he go through, both treadeth down, and teareth in pieces, and none can deliver.
Then the remnant of Jacob will be among the nations, in the midst of many peoples, like a lion among the beasts of the forest, like a young lion among flocks of sheep, which tramples and tears as it passes through, with no one to rescue them.
The remnant of Jacob will be among the nations, among many peoples, like a lion among the animals of the forest, like a young lion among the flocks of sheep; who, if he goes through, treads down and tears in pieces, and there is no one to deliver.
Every translation above is public domain and free to share. Other versions — NIV · ESV · NKJV · NLT · NASB · CSB · AMP — are copyrighted and open on their publishers’ partner site.
5 Ọ ga-abụkwa udo anyị. Mgbe ndị Asịrịa ga-abata nʼala anyị nʼike, sikwa nʼebe niile e wusiri ike nke anyị na-agafe, anyị ga-ahọpụta ndị ọzụzụ atụrụ asaa, ọ bụladị ndịisi asatọ.
6 Onye ga-eji mma agha chịa ala Asịrịa, jirikwa mma agha a mịpụtara amịpụta chịa ala Nimrọd. Ọ ga-anapụta anyị site nʼaka ndị Asịrịa ahụ, mgbe ha ga-eji ike bata nʼala anyị, ma zọrọkwa ije gafee oke ala anyị.
7 Mgbe ahụ, ndị fọdụrụ afọdụ nke Jekọb ga-adị nʼetiti ọtụtụ ndị mmadụ, dịka igirigi si nʼebe Onyenwe anyị nọ abịa, maọbụ dịka mmiri ozuzo ntakịrị na-ezokwasị ahịhịa, nke na-adịghị ele anya mmadụ maọbụ chere ụmụ mmadụ.
8 Ndị fọdụrụ afọdụ nke Jekọb ga-adịkwa nʼetiti ọtụtụ ndị mmadụ dị ka ọdụm nʼetiti anụ ọhịa niile dị iche iche, e, dịka nwa ọdụm nʼetiti igwe atụrụ, nke na-azọda na-adọkasị mgbe ọ na-agabiga, ma o nweghị onye ga-anapụta ya.
9 Aka gị ga-adị elu na mmeri nke ndị iro ya, a ghakwaghị ịla ndị iro gị niile nʼiyi.
10 “Nʼụbọchị ahụ kwa,” otu a ka Onyenwe anyị kwubiri, “Aga m ala ịnyịnya unu nʼiyi site nʼetiti unu, kụjisiekwa ụgbọala unu niile.
11 Aga m ala obodo niile dị nʼala unu nʼiyi, dọdasịakwa ebe unu niile e wusiri ike.
Read Micah 5 in the app The whole chapter