The Bible › Baịbụlụ Nsọ › Micah 3

Micah 3:4

Mgbe ahụ ha ga-akpọku Onyenwe anyị, ma ọ gaghị aza ha! Mgbe oge ahụ bịaruru, ọ ga-ezo ihu ha site nʼebe ha nọ nʼihi ihe ọjọọ nke ha mere.

Micah 3:4 · Baịbụlụ Nsọ

← PreviousRead Micah 3Next →

Micah 3:4 in other translations

KJV King James Version

Then shall they cry unto the LORD, but he will not hear them: he will even hide his face from them at that time, as they have behaved themselves ill in their doings.

BSB Berean Standard Bible

Then they will cry out to the LORD, but He will not answer them. At that time He will hide His face from them because of the evil they have done.

WEB World English Bible

Then they will cry to the LORD, but he will not answer them. Yes, he will hide his face from them at that time, because they made their deeds evil.”

Every translation above is public domain and free to share. Other versions — NIV · ESV · NKJV · NLT · NASB · CSB · AMP — are copyrighted and open on their publishers’ partner site.

In context

1 Mgbe ahụ ekwuru m sị, “Geenụ ntị unu ndịisi ụlọ Jekọb, na unu ndị na-achị ezinaụlọ Izrel. Ọ bụ na unu ekwesighị ịmata ikpe ziri ezi

2 unu bụ ndị kpọrọ ezi ihe asị ma na-ahụ ajọ ọrụ nʼanya. Unu na-agba ndị m akpụkpọ na ndụ na-agbapụkwa anụ ahụ kpuchiri ọkpụkpụ ha.

3 Unu na-erida anụ ahụ ndị nke m, na-agba ha akpụkpọ, na-etijisi ọkpụkpụ ha, na-egburi anụ ahụ ha, dịka anụ a na-esinye nʼite.”

4 Mgbe ahụ ha ga-akpọku Onyenwe anyị, ma ọ gaghị aza ha! Mgbe oge ahụ bịaruru, ọ ga-ezo ihu ha site nʼebe ha nọ nʼihi ihe ọjọọ nke ha mere.

5 Ihe a ka Onyenwe anyị kwuru: “Banyere ndị amụma bụ ndị na-eduhie ndị m, mgbe ha nwere ihe ha ga-eri, ha na-ekwusa ‘Udo’ ma ọ bụrụ na mmadụ enyeghị ha nri, ha na-ebili buo agha megide onye dị otu a.

6 Ya mere nʼabalị ga-abịakwasị ha, napụ ha ike ịhụ ọhụ; ọchịchịrị ga-ekpuchi ha, ka ha ghara ịjụta ase ọbụla. Anwụ ga-ada nʼebe ndị amụma ahụ nọ, ụbọchị ga-agbakwa ọchịchịrị nye ha.

7 Ndị ọhụ ụzọ ka ihere ga-eme, ndị na-ajụ ase ka a ga-emebọ. Ha ga-ekpuchi ihu ha, nʼihi na ọsịsa ọbụla agaghị esite nʼebe Chineke nọ bịara ha.”

Read Micah 3 in the app The whole chapter

Search the Scriptures

Choose a translation

KJVBSBWEBNHEBASVYLTDBYWBTBBEEBRGNVDRALUTCANRIVLSGRVABPMYORIGBSWATGLIRV