The Bible › Baịbụlụ Nsọ › Micah 2

Micah 2:5

Nʼihi ya, ọ dịkwaghị onye ga-afọdụ nʼetiti ọgbakọ nke Onyenwe anyị, onye ga-eji ihe ọtụtụ kee ala ahụ site nʼife nza.

Micah 2:5 · Baịbụlụ Nsọ

← PreviousRead Micah 2Next →

Micah 2:5 in other translations

KJV King James Version

Therefore thou shalt have none that shall cast a cord by lot in the congregation of the LORD.

BSB Berean Standard Bible

Therefore, you will have no one in the assembly of the LORD to divide the land by lot.

WEB World English Bible

Therefore you will have no one who divides the land by lot in the LORD’s assembly.

Every translation above is public domain and free to share. Other versions — NIV · ESV · NKJV · NLT · NASB · CSB · AMP — are copyrighted and open on their publishers’ partner site.

In context

2 Ha na-enwe anya ukwu nʼebe ubi ndị ọzọ dị, were ha nʼaka ike, na ụlọ dị iche iche, ha ewere ha nʼike. Ha na-ejikwa aka ike nara ndị mmadụ ụlọ ha, ha na-ezunara ha ihe nketa ha.

3 Nʼihi nke a, Onyenwe anyị na-asị, “Lee, ana m akwado ihe ọjọọ megide agbụrụ a, nke unu na-enweghị ike isite na ya wezuga onwe unu. Unu agaghị eji nganga na-ejegharịkwa, nʼihi na ọ ga-abụ oge ọjọọ.

4 Nʼụbọchị ahụ ha ga-akọcha unu, ha ga-abụrụ unu abụ iru ụjụ iji ya kọchaa unu na-asị, ‘Anyị abụrụla ndị lara nʼiyi, e kesaala ihe nnweta nke ndị m, ọ napụla m ha. O werela ubi anyị nyefee ha nʼaka ndị ahụ meriri anyị nʼagha.’ ”

5 Nʼihi ya, ọ dịkwaghị onye ga-afọdụ nʼetiti ọgbakọ nke Onyenwe anyị, onye ga-eji ihe ọtụtụ kee ala ahụ site nʼife nza.

6 Ndị amụma ha na-asị, “Unu ebukwala amụma.” “Unu ebukwala amụma banyere ihe ndị a, ihere agaghị eme anyị.”

7 Ụdị ihe a o kwesiri okwukwu, gị ụlọ Jekọb? “Ntachiobi Onyenwe anyị ọ gwụla? Ihe ndị a ọ bụ otu o si eme?” “Ọ bụ na okwu m adịghị eme onye ụzọ ya ziri ezi mma?

8 Ma ọ bụ unu na-ebili megide ndị m dịka ndị iro. Unu na-eyipụ ndị na-agafe agafe uwe ọma ha yi nʼahụ ha na-enweghị mmetụta, dịka a ga-asị na unu bụ ndị si nʼagha na-alọta.

Read Micah 2 in the app The whole chapter

Search the Scriptures

Choose a translation

KJVBSBWEBNHEBASVYLTDBYWBTBBEEBRGNVDRALUTCANRIVLSGRVABPMYORIGBSWATGLIRV