The Bible › Baịbụlụ Nsọ › Matthew 8

Matthew 8:12

Ma ụmụ alaeze ahụ, ka a ga-atụpụ nʼezi, nʼime ọchịchịrị, ebe ịkwa akwa na ịta ikikere eze ga-adị.”

Matthew 8:12 · Baịbụlụ Nsọ

← PreviousRead Matthew 8Next →

Matthew 8:12 in other translations

KJV King James Version

But the children of the kingdom shall be cast out into outer darkness: there shall be weeping and gnashing of teeth.

BSB Berean Standard Bible

But the sons of the kingdom will be thrown into the outer darkness, where there will be weeping and gnashing of teeth.”

WEB World English Bible

but the children of the Kingdom will be thrown out into the outer darkness. There will be weeping and gnashing of teeth.”

Every translation above is public domain and free to share. Other versions — NIV · ESV · NKJV · NLT · NASB · CSB · AMP — are copyrighted and open on their publishers’ partner site.

In context

9 Nʼihi na mụ onwe m bụkwa onye nọ nʼokpuru ikike ọchịchị, nwee ndị agha nọ nʼokpuru m. Ana m asị onye nke a, ‘gaa.’ Ọ gaa, sịkwa onye nke ọzọ, ‘bịa.’ Ọ bịa. Ana m asị ohu m, ‘mee nke a.’ Ọ na-emekwa ya.”

10 Mgbe Jisọs nụrụ okwu a, o juru ya anya nke ukwuu. Ọ gwara igwe mmadụ ahụ so ya okwu sị, “Nʼezie, ahụbeghị m okwukwe dị otu a ebe ọbụla; ọ bụladị nʼIzrel niile.

11 Nʼezie kwa, ọtụtụ ndị mmadụ ga-esite nʼọwụwa anyanwụ nakwa ọdịda anyanwụ bịa soro Ebraham na Aịzik na Jekọb nọkọọ nʼoriri nʼalaeze eluigwe.

12 Ma ụmụ alaeze ahụ, ka a ga-atụpụ nʼezi, nʼime ọchịchịrị, ebe ịkwa akwa na ịta ikikere eze ga-adị.”

13 Jisọs gwara ọchịagha ahụ okwu sị ya, “Laa! E meerela gị dị ka okwukwe gị sịrị dị.” Ahụ dịrị onye ahụ na-ejere ya ozi mma nʼotu awa ahụ.

14 Mgbe Jisọs ruru nʼụlọ Pita, ọ chọpụtara na nne nwunye ya nwere ahụ ọkụ.

15 Ọ metụrụ ya aka, ahụ ọkụ ahụ hapụrụ ya, o biliri malite ijere ya ozi.

Read Matthew 8 in the app The whole chapter

Search the Scriptures

Choose a translation

KJVBSBWEBNHEBASVYLTDBYWBTBBEEBRGNVDRALUTCANRIVLSGRVABPMYORIGBSWATGLIRV