The Bible › Baịbụlụ Nsọ › Matthew 7

Matthew 7:3

“Gịnị mere i ji elee ntakịrị ahịhịa dị nwanna gịnʼanya ma ị dịghị ahụta obodobo osisi dị gị onwe gị nʼanya?

Matthew 7:3 · Baịbụlụ Nsọ

← PreviousRead Matthew 7Next →

Matthew 7:3 in other translations

KJV King James Version

And why beholdest thou the mote that is in thy brother's eye, but considerest not the beam that is in thine own eye?

BSB Berean Standard Bible

Why do you look at the speck in your brother’s eye, but fail to notice the beam in your own eye?

WEB World English Bible

Why do you see the speck that is in your brother’s eye, but don’t consider the beam that is in your own eye?

Every translation above is public domain and free to share. Other versions — NIV · ESV · NKJV · NLT · NASB · CSB · AMP — are copyrighted and open on their publishers’ partner site.

In context

1 “Unu ekpela ndị ọzọ ikpe, ka a ghara ikpekwa unu ikpe.

2 Nʼihi na a ga-ekpe unu ikpe dịka unu si kpee ndị ọzọ. Ọ bụkwa ihe unu ji tụọrọ ndị ọzọ ka a ga-eji tụọrọ unu.

3 “Gịnị mere i ji elee ntakịrị ahịhịa dị nwanna gịnʼanya ma ị dịghị ahụta obodobo osisi dị gị onwe gị nʼanya?

4 Olee otu ị ga-esi gwa ya si, ‘Nwanna m, kwere ka m tụpụ gị ntakịrị ahịhịa danyere gị nʼanya,’ mgbe obodobo osisi dị gị nʼanya, nke na-adịghị ekwe gị hụzie ụzọ.

5 Onye ihu abụọ! Buru ụzọ wepụ obodobo osisi dị gị nʼanya ka i nwee ike ịhụzi ụzọ tụpụ ntakịrị ahịhịa nke dị nwanna gị nʼanya.

6 “Enyela nkịta ihe dị nsọ. Enyekwala ezi ihe dị oke ọnụahịa. Ha ga-azọtọ ha ma tụgharịakwa dọrie gị.

Read Matthew 7 in the app The whole chapter

Search the Scriptures

Choose a translation

KJVBSBWEBNHEBASVYLTDBYWBTBBEEBRGNVDRALUTCANRIVLSGRVABPMYORIGBSWATGLIRV