The Bible › Baịbụlụ Nsọ › Matthew 4
ndị nọ nʼọchịchịrị ahụla ìhè dị ukwuu. Ndị bi nʼala onyinyo ọnwụ ka ìhè nwukwasịrị.”
Matthew 4:16 · Baịbụlụ Nsọ
← PreviousRead Matthew 4Next →
The people which sat in darkness saw great light; and to them which sat in the region and shadow of death light is sprung up.
the people living in darkness have seen a great light; on those living in the land of the shadow of death, a light has dawned.”
the people who sat in darkness saw a great light; to those who sat in the region and shadow of death, to them light has dawned.”
Every translation above is public domain and free to share. Other versions — NIV · ESV · NKJV · NLT · NASB · CSB · AMP — are copyrighted and open on their publishers’ partner site.
13 Emesịa, ọ hapụrụ Nazaret gaa biri na Kapanọm, bụ obodo dị nʼakụkụ osimiri Galili. Ọ dị nso nʼoke ala Zebụlọn na Naftalị.
14 Nʼụzọ dị otu a, amụma ahụ Aịzaya buru mezuru. Amụma nke sịrị,
15 “Ala Zebụlọn na ala Naftalị, nke dị nʼakụkụ osimiri, nʼofe Jọdan, Galili nke ndị mba ọzọ,
16 ndị nọ nʼọchịchịrị ahụla ìhè dị ukwuu. Ndị bi nʼala onyinyo ọnwụ ka ìhè nwukwasịrị.”
17 Site nʼoge ahụ gaa nʼihu Jisọs bidoro na-ekwusa na-asị, “Chegharịanụ, nʼihi na alaeze eluigwe dị nso.”
18 Ma mgbe Jisọs na-agafe nʼakụkụ osimiri Galili, ọ hụrụ ụmụnne abụọ, Saimọn onye a na-akpọ Pita, na Andru nwanne ya, ndị ọrụ ha bụ ịkụ azụ, ebe ha nọ nʼụgbọ mmiri na-akụ azụ.
19 Ọ sịrị ha, “Bịanụ soro m. Aga m eme unu ndị ọkụ na-akụta mmadụ.”
Read Matthew 4 in the app The whole chapter