The Bible › Baịbụlụ Nsọ › Matthew 19

Matthew 19:13

Mgbe ahụ e kuteere ya ụmụntakịrị ka o bikwasị ha aka, kpeekwara ha ekpere. Ma ndị na-eso ụzọ ya baara ndị kutere ha mba.

Matthew 19:13 · Baịbụlụ Nsọ

← PreviousRead Matthew 19Next →

Matthew 19:13 in other translations

KJV King James Version

Then were there brought unto him little children, that he should put his hands on them, and pray: and the disciples rebuked them.

BSB Berean Standard Bible

Then the little children were brought to Jesus for Him to place His hands on them and pray for them. And the disciples rebuked those who brought them.

WEB World English Bible

Then little children were brought to him that he should lay his hands on them and pray; and the disciples rebuked them.

Every translation above is public domain and free to share. Other versions — NIV · ESV · NKJV · NLT · NASB · CSB · AMP — are copyrighted and open on their publishers’ partner site.

In context

10 Ndị na-eso ụzọ ya sịrị ya, “Ọ bụrụ na o si otu a dịrị, ọ ka mma na mmadụ alụghị nwunye ma ọlị.”

11 Ma ọ zara sị ha, “Ọ bụghị mmadụ niile ga-anagide okwu a. Naanị ndị e nyere ike ime ya ga-anagide ya.

12 Ma ụfọdụ ndị mmadụ ka a mụrụ ka ha bụrụ onozi, ndị ọzọ bụkwa ndị mmadụ ibe ha mere otu a. Ndị ọzọ dịkwa ndị jiri aka ha họrọ ibu onozinʼihi alaeze eluigwe. Onye pụrụ ịnara nke a, ya nara ya.”

13 Mgbe ahụ e kuteere ya ụmụntakịrị ka o bikwasị ha aka, kpeekwara ha ekpere. Ma ndị na-eso ụzọ ya baara ndị kutere ha mba.

14 Ma Jisọs sịrị ha, “Kweenụ ka ụmụntakịrị bịakwute m, unu egbochikwala ha. Nʼihi na alaeze eluigwe bụ nke ndị dị otu a.”

15 O bikwasịrị ha aka nʼisi gọzie ha niile tupu ọ hapụ ha pụọ.

16 Otu onye bịakwutere ya, jụọ ya ajụjụ sị, “Ezi onye ozizi, olee ezi ihe m ga-eme ka m keta ndụ ebighị ebi?”

Read Matthew 19 in the app The whole chapter

Search the Scriptures

Choose a translation

KJVBSBWEBNHEBASVYLTDBYWBTBBEEBRGNVDRALUTCANRIVLSGRVABPMYORIGBSWATGLIRV