The Bible › Baịbụlụ Nsọ › Matthew 15
Jisọs hapụrụ obodo ahụ gaa nʼakụkụ obodo Taịa na Saịdọn.
Matthew 15:21 · Baịbụlụ Nsọ
← PreviousRead Matthew 15Next →
Then Jesus went thence, and departed into the coasts of Tyre and Sidon.
Leaving that place, Jesus withdrew to the district of Tyre and Sidon.
Jesus went out from there and withdrew into the region of Tyre and Sidon.
Every translation above is public domain and free to share. Other versions — NIV · ESV · NKJV · NLT · NASB · CSB · AMP — are copyrighted and open on their publishers’ partner site.
18 Ma ihe si mmadụ nʼọnụ pụta na-esi ya nʼobi apụta. Ọ bụ ihe dị otu a na-emerụ mmadụ.
19 Nʼihi na ọ bụ nʼime obi mmadụ ka echiche ime ihe ọjọọ ndị a si apụta: igbu mmadụ, ịkwa iko niile, ịkwa iko nke ndị ikom nwere nwunye na ndị inyom nwere di, na izu ohi, na ama ụgha, na nkwulu.
20 Ihe ndị a bụ ihe na-emerụ mmadụ, ọ bụghị ma mmadụ kwọrọ aka tupu o rie nri, maọbụ na ọ kwọghị.”
21 Jisọs hapụrụ obodo ahụ gaa nʼakụkụ obodo Taịa na Saịdọn.
22 Nʼebe ahụ, otu nwanyị onye Kenan bi nʼobodo ahụ bịakwutere ya rịọọ ya sị, “Onyenwe m, nwa Devid, biko meere m ebere. Ada m nwanyị nwere ajọ mmụọ nʼime ya nke na-esogbu ya oge niile.”
23 Ma ọ gbara ya nkịtị. Emesịa ndị na-eso ụzọ ya bịakwutere ya rịọ ya sị ya, “Chụlaa nwanyị a! Lee ka o si eti mkpu na-esogharị anyị!”
24 Ọ zara sị, “Ezitere m naanị ijekwuru atụrụ furu efu nke ụlọ Izrel.”
Read Matthew 15 in the app The whole chapter