The Bible › Baịbụlụ Nsọ › Mark 8
Ha nwekwara azụ ole na ole. O weere ya kpee ekpere, ọ gwara ha ka ha kesaakwa ya.
Mark 8:7 · Baịbụlụ Nsọ
And they had a few small fishes: and he blessed, and commanded to set them also before them.
They also had a few small fish, and Jesus blessed them and ordered that these be set before them as well.
They also had a few small fish. Having blessed them, he said to serve these also.
Every translation above is public domain and free to share. Other versions — NIV · ESV · NKJV · NLT · NASB · CSB · AMP — are copyrighted and open on their publishers’ partner site.
4 Ndị na-eso ụzọ ya zara ya, “Ebee ka mmadụ ga-achọta achịcha ga-ezuru ndị a nʼime ọzara a?”
5 Jisọs jụrụ ha sị, “Ogbe achịcha ole ka unu nwere?” Ha zara sị, “Asaa.”
6 Ọ gwara igwe mmadụ ahụ ka ha nọdụ ala. O weere ogbe achịcha asaa ahụ kpee ekpere. Ọ nyawasịrị ha, nye ha ndị na-eso ụzọ ya ka ha kee igwe mmadụ ahụ niile. Ha kekwara ya nye igwe mmadụ ahụ.
7 Ha nwekwara azụ ole na ole. O weere ya kpee ekpere, ọ gwara ha ka ha kesaakwa ya.
8 Ha riri, rijuo afọ. Ha tụtụkọtara iberibe achịcha dafuru nʼebe ndị a nọ rie nri. Ha tụtụjuru nkata asaa.
9 Ndị riri nri a ruru ihe dịka puku mmadụ anọ. Mgbe ahụ o zilagara ha.
10 Ngwangwa, ya na ndị na-eso ụzọ ya banyere nʼụgbọ mmiri gaa nʼakụkụ obodo Dalmanuta.
Read Mark 8 in the app The whole chapter