The Bible › Baịbụlụ Nsọ › Mark 6
Ha tụtụkọtara iberibe achịcha na azụ tụtụjuo nkata iri na abụọ.
Mark 6:43 · Baịbụlụ Nsọ
And they took up twelve baskets full of the fragments, and of the fishes.
and the disciples picked up twelve basketfuls of broken pieces of bread and fish.
They took up twelve baskets full of broken pieces and also of the fish.
Every translation above is public domain and free to share. Other versions — NIV · ESV · NKJV · NLT · NASB · CSB · AMP — are copyrighted and open on their publishers’ partner site.
40 Ya mere, ha nọdụrụ ala, iri mmadụ ise nʼotu ebe, narị mmadụ nʼebe ọzọ.
41 Ọ naara ogbe achịcha ise na azụ abụọ ndị ahụ, welie anya ya elu, nye ekele. Ọ nyawara achịcha ahụ nye ya ndị na-eso ụzọ ya ka ha kee ndị mmadụ ahụ. Otu aka ahụkwa ọ nyawakwara azụ abụọ ahụ nyekwa ha niile.
42 Ha niile riri rijuo afọ.
43 Ha tụtụkọtara iberibe achịcha na azụ tụtụjuo nkata iri na abụọ.
44 Ọnụọgụgụ ndị nwoke riri ogbe achịcha ahụ dị puku mmadụ ise.
45 Ngwangwa, o mere ka ndị na-eso ụzọ ya banye nʼụgbọ mmiri buru ya ụzọ gafee nʼofe nke ọzọ nke osimiri Betsaida, ebe ya onwe ya nọdụrụ izilaga igwe mmadụ ahụ.
46 Mgbe ndị a niile lachara, ọ rigooro nʼelu ugwu ikpe ekpere.
Read Mark 6 in the app The whole chapter