The Bible › Baịbụlụ Nsọ › Mark 6
O wutere eze nke ukwuu, ma nʼihi iyi ọ ṅụrụ, na nʼihi ndị ọ kpọrọ oriri, ọ chọghị ịjụ inye ya ihe ọ rịọrọ ya.
Mark 6:26 · Baịbụlụ Nsọ
And the king was exceeding sorry; yet for his oath's sake, and for their sakes which sat with him, he would not reject her.
The king was consumed with sorrow, but because of his oaths and his guests, he did not want to refuse her.
The king was exceedingly sorry, but for the sake of his oaths and of his dinner guests, he didn’t wish to refuse her.
Every translation above is public domain and free to share. Other versions — NIV · ESV · NKJV · NLT · NASB · CSB · AMP — are copyrighted and open on their publishers’ partner site.
23 O kwere ya nkwa ṅụọkwa iyi sị, “Ihe ọbụla ị rịọrọ m aga m enye gị, ọ bụladị ọkara alaeze m.”
24 Ọ jekwuru nne ya jụọ ya sị, “Gịnị ka m ga-arịọ?” Ọ zara ya sị, “Isi Jọn omee baptizim.”
25 Ngwangwa, ọ bịakwutere eze rịọ ya sị, “Achọrọ m ka i nye m, ugbu a, nʼime efere, isi Jọn omee baptizim.”
26 O wutere eze nke ukwuu, ma nʼihi iyi ọ ṅụrụ, na nʼihi ndị ọ kpọrọ oriri, ọ chọghị ịjụ inye ya ihe ọ rịọrọ ya.
27 Ngwangwa o zipụrụ onye agha na-eche nche nye ya iwu ka ọ gaa bute isi Jọn. Ọ gara, bipụ isi Jọn nʼụlọ mkpọrọ,
28 tinye isi ahụ nʼime efere butere nwaagbọghọ ahụ onye nara ya bunye nne ya.
29 Mgbe ndị na-eso ụzọ ya nụrụ nke a, ha bịara buru ozu ya gaa lie.
Read Mark 6 in the app The whole chapter