The Bible › Baịbụlụ Nsọ › Mark 3
O kwuru nke a nʼihi na ha na-asị, “Mmụọ na-adịghị ọcha bi nʼime ya.”
Mark 3:30 · Baịbụlụ Nsọ
Because they said, He hath an unclean spirit.
Jesus made this statement because they were saying, “He has an unclean spirit.”
—because they said, “He has an unclean spirit.”
Every translation above is public domain and free to share. Other versions — NIV · ESV · NKJV · NLT · NASB · CSB · AMP — are copyrighted and open on their publishers’ partner site.
27 Nʼezie, ọ dịghị onye nwere ike ịbanye nʼụlọ nwoke dị ike kwakọrọ ngwongwo ya niile, ma o bughị ụzọ kee nwoke ahụ siri ike agbụ. Mgbe ahụ ọ ga-enwe ike ịbanye nʼụlọ ya, zukọrọ ngwongwo ya niile.
28 Nʼezie agwa m unu, na a ga-agbaghara ụmụ mmadụ mmehie na nkwulu niile nke ha kwuru.
29 Ma onye ọbụla ga-ekwulu Mmụọ Nsọ, enweghị ike ịgbaghara ya. Ọ bụ onye ikpe mmehie ebighị ebi mara.”
30 O kwuru nke a nʼihi na ha na-asị, “Mmụọ na-adịghị ọcha bi nʼime ya.”
31 Mgbe ahụ, nne ya na ụmụnne ya ndị nwoke bịara, guzoro nʼezi. Ha ziri ozi ka a kpọọ ya.
32 Igwe mmadụ gbara ya gburugburu mgbe ahụ gwara ya sị, “Lee, nne gị na ụmụnne gị ndị nwoke na ndị nwanyị guzo nʼezi. Ha chọrọ ịhụ gị.”
33 Ọ zara sị, “Onye bụ nne m, ndị ole bụkwa ụmụnne m ndị nwoke?”
Read Mark 3 in the app The whole chapter