The Bible › Baịbụlụ Nsọ › Mark 3
Ma ọ kpọrọ ha jiri ilu gwa ha okwu sị, “Ekwensu ọ pụrụ ịchụpụ ekwensu?
Mark 3:23 · Baịbụlụ Nsọ
And he called them unto him, and said unto them in parables, How can Satan cast out Satan?
So Jesus called them together and began to speak to them in parables: “How can Satan drive out Satan?
He summoned them and said to them in parables, “How can Satan cast out Satan?
Every translation above is public domain and free to share. Other versions — NIV · ESV · NKJV · NLT · NASB · CSB · AMP — are copyrighted and open on their publishers’ partner site.
20 Emesịa, ọ lọtara nʼụlọ, ma igwe mmadụ gbakọtakwara ọzọ nke mere na ha enweghị ohere iri nri.
21 Mgbe ndị ikwu ya nụrụ nke a, ha bịara gbalịa idulata ya nʼụlọ ha, nʼihi na ndị mmadụ na-asị, “Isi adịghị ya mma.”
22 Ma ndị ozizi iwu si Jerusalem bịa sịrị, “Mmụọ Belzebub bi nʼime ya! Ọ bụkwa nʼike onyeisi ndị mmụọ ọjọọ ka o ji achụpụ mmụọ ọjọọ.”
23 Ma ọ kpọrọ ha jiri ilu gwa ha okwu sị, “Ekwensu ọ pụrụ ịchụpụ ekwensu?
24 Ọ bụrụ na alaeze ekewa megide onwe ya alaeze ahụ apụghị iguzo.
25 Ọ bụrụ na ezinaụlọ ekewa megide onwe ya, ezinaụlọ ahụ apụghị iguzo.
26 Ọ bụrụkwa na ekwensu ebilie megide onwe ya si otu a nwee nkewa, o nweghị ike iguzo; kama ọgwụgwụ oge ya abịala nso.
Read Mark 3 in the app The whole chapter