The Bible › Baịbụlụ Nsọ › Mark 15
Ndị agha ahụ duuru ya pụọ baa nʼime ụlọeze a na-akpọ Pritoriọm. Ha kpọkọtakwara ndị agha ndị otu ha ndị ọzọ.
Mark 15:16 · Baịbụlụ Nsọ
And the soldiers led him away into the hall, called Praetorium; and they call together the whole band.
Then the soldiers led Jesus away into the palace (that is, the Praetorium) and called the whole company together.
The soldiers led him away within the court, which is the Praetorium; and they called together the whole cohort.
Every translation above is public domain and free to share. Other versions — NIV · ESV · NKJV · NLT · NASB · CSB · AMP — are copyrighted and open on their publishers’ partner site.
13 Ma ha tiri mkpu ọzọ sị, “Kpọgide ya nʼobe!”
14 Ma Pailet jụrụ ha sị, “Ọ bụ nʼihi gịnị? Olee ihe ọjọọ o mere?” Ma ha tiri mkpu karịa ka ha si eti na mbụ, na-asị, “Kpọgide ya nʼobe!”
15 Ma ebe Pailet chọrọ ime ihe ga-atọ igwe mmadụ ahụ ụtọ, ọ hapụụrụ ha Barabas, nyefee ha Jisọs nʼaka ka ha pịa ya ihe ma kpọgidekwa ya nʼobe.
16 Ndị agha ahụ duuru ya pụọ baa nʼime ụlọeze a na-akpọ Pritoriọm. Ha kpọkọtakwara ndị agha ndị otu ha ndị ọzọ.
17 Ha yinyere ya uwe mwụda na-acha odo odo, kpukwasịkwa ya okpueze nke e ji ogwu kpaa nʼisi.
18 Emesịa, ha malitere na-ekele ya sị, “Ekele, eze ndị Juu.”
19 Ha ji osisi kụọ ya nʼisi ọtụtụ mgbe, na-agbụ ya ọnụ mmiri asọ. Ha gbukwara ikpere nʼihu ya, na-akpọ isiala na-enye ya.
Read Mark 15 in the app The whole chapter