The Bible › Baịbụlụ Nsọ › Mark 11
Ọtụtụ mmadụ tụsara uwe ha nʼokporoụzọ, ma ndị ọzọ tụsara alaka osisi ha gbutere nʼọhịa.
Mark 11:8 · Baịbụlụ Nsọ
And many spread their garments in the way: and others cut down branches off the trees, and strawed them in the way.
Many in the crowd spread their cloaks on the road, while others spread branches they had cut from the fields.
Many spread their garments on the way, and others were cutting down branches from the trees and spreading them on the road.
Every translation above is public domain and free to share. Other versions — NIV · ESV · NKJV · NLT · NASB · CSB · AMP — are copyrighted and open on their publishers’ partner site.
5 ụfọdụ mmadụ guzo nʼebe ahụ sịrị ha, “Gịnị ka unu na-eme, unu na-atọpụ nwa ịnyịnya a?”
6 Ha gwara ha ihe Jisọs kwuru, ha hapụkwara ha ka ha tọrọ ịnyịnya ibu ahụ.
7 Ha kpụtaara Jisọs nwa ịnyịnya ahụ, ma wụkwasịkwa uwe ha nʼelu ya, ọ nọkwasịrị nʼelu ya.
8 Ọtụtụ mmadụ tụsara uwe ha nʼokporoụzọ, ma ndị ọzọ tụsara alaka osisi ha gbutere nʼọhịa.
9 Ndị na-aga nʼihu na ndị na-esokwa nʼazụ, tiri mkpu na-asị, “Hozanna!” “Onye a gọziri agọzi ka onye ahụ bụ nke na-abịa nʼaha Onyenwe anyị!”
10 “Ngọzị dịrị alaeze ahụ na-abịa nke nna anyị Devid!” “Hozanna nʼebe kachasị ihe niile elu!”
11 Mgbe ọ batara na Jerusalem, ọ gara nʼime nʼụlọnsọ ukwu ahụ. Mgbe o legharịchara anya nʼihe niile dị nʼebe ahụ, ma ebe ọ bụ na chi ejiela, ya na ndị na-eso ụzọ ya pụrụ gaa Betani.
Read Mark 11 in the app The whole chapter