The Bible › Baịbụlụ Nsọ › Luke 9
Nʼechi ya, mgbe ha si nʼugwu ahụ rịdata, oke igwe mmadụ bịara zute ya.
Luke 9:37 · Baịbụlụ Nsọ
And it came to pass, that on the next day, when they were come down from the hill, much people met him.
The next day, when they came down from the mountain, Jesus was met by a large crowd.
On the next day, when they had come down from the mountain, a great multitude met him.
Every translation above is public domain and free to share. Other versions — NIV · ESV · NKJV · NLT · NASB · CSB · AMP — are copyrighted and open on their publishers’ partner site.
34 Mgbe ọ ka kpụ okwu nʼọnụ, igwe ojii pụtara kpuchie ha. Egwu tụkwara ha dị ka ha na-aba nʼigwe ojii ahụ.
35 Olu sitere nʼigwe ojii ahụ daa sị, “Onye a bụ Ọkpara m, onye m họpụtara; geenụ ya ntị.”
36 Mgbe olu ahụ kwusiri okwu, ha chọpụtara na Jisọs nọ naanị ya. Ndị na-eso ụzọ ya kpuchiri ọnụ ha, debe ihe niile nʼobi ha, ọ dịkwaghị onye ọbụla ha gwara ihe ha hụrụ.
37 Nʼechi ya, mgbe ha si nʼugwu ahụ rịdata, oke igwe mmadụ bịara zute ya.
38 Otu nwoke si nʼetiti igwe mmadụ ahụ jiri oke olu tie mkpu sị, “Onye ozizi, arịọ m gị ka i lee nwa m nwoke anya, nʼihi na naanị ya bụ nwa m nwere.
39 Mmụọ ọjọọ na-ejide ya mee ka ọ na-eti mkpu. Ọ na-atụda ya nʼala, na-ese ya ese, na-adọkwa ya adọ mee ka ọ na-agbọ ụfụfụ nʼọnụ. Ọ dịghị mgbe ọ na-ahapụ ya kama ọ na-echihịasị ya ahụ.
40 Arịọrọ m ndị na-eso ụzọ gị ka ha chụpụ ya, ma ha enweghị ike.”
Read Luke 9 in the app The whole chapter