The Bible › Baịbụlụ Nsọ › Luke 4
Jisọs, onye jupụtara na Mmụọ Nsọ, sitere na Jọdan lọta. Mmụọ nsọ duuru ya baa nʼọzara.
Luke 4:1 · Baịbụlụ Nsọ
And Jesus being full of the Holy Ghost returned from Jordan, and was led by the Spirit into the wilderness,
Then Jesus, full of the Holy Spirit, returned from the Jordan and was led by the Spirit into the wilderness,
Jesus, full of the Holy Spirit, returned from the Jordan and was led by the Spirit into the wilderness
Every translation above is public domain and free to share. Other versions — NIV · ESV · NKJV · NLT · NASB · CSB · AMP — are copyrighted and open on their publishers’ partner site.
1 Jisọs, onye jupụtara na Mmụọ Nsọ, sitere na Jọdan lọta. Mmụọ nsọ duuru ya baa nʼọzara.
2 Ebe ahụ ka ekwensu nwara ya ọnwụnwa iri ụbọchị anọ. Nʼụbọchị ndị ahụ niile o righị nri ọbụla. Nʼikpeazụ agụụ gụrụ ya.
3 Ekwensu sịrị ya, “Ọ bụrụ na ị bụ Ọkpara Chineke, gwa nkume a ka ọ ghọọ achịcha.”
4 Jisọs zara ya sị, “E dere ya, ‘Ọ bụghị naanị site na achịcha ka mmadụ ga-eji dị ndụ.’ ”
Read Luke 4 in the app The whole chapter