The Bible › Baịbụlụ Nsọ › Luke 22
Otu mmụọ ozi si nʼeluigwe bịakwutere ya, gbaakwa ya ume.
Luke 22:43 · Baịbụlụ Nsọ
And there appeared an angel unto him from heaven, strengthening him.
Then an angel from heaven appeared to Him and strengthened Him.
An angel from heaven appeared to him, strengthening him.
Every translation above is public domain and free to share. Other versions — NIV · ESV · NKJV · NLT · NASB · CSB · AMP — are copyrighted and open on their publishers’ partner site.
40 Mgbe o ruru nʼebe ahụ, ọ sịrị ha, “Kpeenụ ekpere ka unu ghara ịdaba nʼọnwụnwa.”
41 Ọ hapụrụ ha gaa ihe ha ka nzọ ụkwụ ole na ole nọrọ nʼebe ahụ gbuo ikpere nʼala kpee ekpere, sị,
42 “Nna ọ bụrụ na ị chọrọ, nara m iko a, ma otu ọ dị, ọ bụghị ka e mee uche m, kama ka e mezuo uche gị.”
43 Otu mmụọ ozi si nʼeluigwe bịakwutere ya, gbaakwa ya ume.
44 Site nʼoke ihe mgbu, o kpere ekpere kpesie ike, nke mere na ọsụsọ si ya nʼahụ na-adapụ nʼala dị ka ọkpụrụkpụ ọbara.
45 Mgbe o kpechara ekpere bilie, ọ bịakwutere ndị na-eso ụzọ ya hụ ha ka ha na-arahụ ụra nʼihi ihe mwute nke obi.
46 Ọ sịrị ha, “Gịnị mere unu ji na-arahụ ụra? Bilienụ kpee ekpere ka unu ghara ịdaba nʼọnwụnwa.”
Read Luke 22 in the app The whole chapter