The Bible › Baịbụlụ Nsọ › Luke 22
Ọ bụ unu onwe unu bụ ndị nọnyere m nʼoge ọnwụnwa m niile.
Luke 22:28 · Baịbụlụ Nsọ
Ye are they which have continued with me in my temptations.
You are the ones who have stood by Me in My trials.
“But you are those who have continued with me in my trials.
Every translation above is public domain and free to share. Other versions — NIV · ESV · NKJV · NLT · NASB · CSB · AMP — are copyrighted and open on their publishers’ partner site.
25 Ma ọ sịrị ha, “Ndị eze ndị mba ọzọ na-eji aka ike na-achị ndị nọ nʼokpuru ha. Otu aka ahụkwa, a na-akpọ ndị na-achị achị enyi ndị mmadụ.
26 Ma unu onwe unu agaghị adị otu a. Kama onye kachasị ibe ya ịdị elu dịrị ka onye dịkarịsịrị nta. Ka onyeisi dịrị ka onye na-eje ozi.
27 Onye dị elu karịa ibe ya? Ọ bụ onye nọdụrụ ala rie nri na tebul ka ọ bụ onye siri nri dozie ya na tebul? Ọ bụghị onye nọdụrụ ala rie nri na tebul? Ma adị m ka onye na-eje ozi nʼetiti unu.
28 Ọ bụ unu onwe unu bụ ndị nọnyere m nʼoge ọnwụnwa m niile.
29 Ana m enye unu alaeze dị ka Nna m nyere m ya.
30 Ka unu nwe ike isoro m rie ma ṅụọkwa nʼalaeze m. Sorokwa m nọdụ nʼocheeze na-ekpe ebo iri na abụọ nke Izrel ikpe.
31 “Saimọn, Saimọn, lee ekwensu arịọla ike ịyọcha unu dị ka ọka wiiti.
Read Luke 22 in the app The whole chapter