The Bible › Baịbụlụ Nsọ › Luke 20
Ọ bụrụkwanụ na anyị asị na, ‘o sitere nʼaka mmadụ,’ ndị mmadụ ga-atụ anyị nkume, nʼihi na ha niile kweere na Jọn bụ onye amụma.”
Luke 20:6 · Baịbụlụ Nsọ
But and if we say, Of men; all the people will stone us: for they be persuaded that John was a prophet.
But if we say, ‘From men,’ all the people will stone us, for they are convinced that John was a prophet.”
But if we say, ‘From men,’ all the people will stone us, for they are persuaded that John was a prophet.”
Every translation above is public domain and free to share. Other versions — NIV · ESV · NKJV · NLT · NASB · CSB · AMP — are copyrighted and open on their publishers’ partner site.
3 Ọ zara ha sị, “Aga m ajụkwa unu otu ajụjụ. Gwanụ m,
4 baptizim nke Jọn, o si nʼeluigwe ka o si nʼaka mmadụ?”
5 Ha kparịtara ụka nʼetiti onwe ha ma sị, “Ọ bụrụ na anyị asị na o sitere nʼeluigwe, ọ ga-asị, ‘Gịnị mere unu na-ejighị kwenye na ya?’
6 Ọ bụrụkwanụ na anyị asị na, ‘o sitere nʼaka mmadụ,’ ndị mmadụ ga-atụ anyị nkume, nʼihi na ha niile kweere na Jọn bụ onye amụma.”
7 Ya mere, ha zara, “Anyị amaghị ebe o si bịa.”
8 Jisọs sịrị ha, “Enwekwaghị m ike ịgwa unu ikike m ji na-eme ihe ndị a.”
9 Ọ gara nʼihu tụọrọ ndị mmadụ ilu a sị, “Otu nwoke nwere ubi vaịnị, nke o nyefere nʼaka ndị ga-elekọta ya anya ma pụọ gaa njem nʼala ọzọ ebe ọ nọrọ ogologo oge.
Read Luke 20 in the app The whole chapter