The Bible › Baịbụlụ Nsọ › Luke 2
Mgbe o ruru afọ iri na abụọ, ha gara maka mmemme dị ka omenaala si dị.
Luke 2:42 · Baịbụlụ Nsọ
And when he was twelve years old, they went up to Jerusalem after the custom of the feast.
And when He was twelve years old, they went up according to the custom of the Feast.
When he was twelve years old, they went up to Jerusalem according to the custom of the feast;
Every translation above is public domain and free to share. Other versions — NIV · ESV · NKJV · NLT · NASB · CSB · AMP — are copyrighted and open on their publishers’ partner site.
39 Mgbe ha mesịrị ihe niile otu ọ dị nʼiwu Onyenwe anyị, ha laghachiri obodo ha bụ Nazaret nke dị nʼime Galili.
40 Ma nwata ahụ toro bụrụ onye dị ike; o jupụtara nʼamamihe, amara Chineke dịnyekwaara ya.
41 Nʼafọ niile, ndị mụrụ ya na-aga Jerusalem nʼihi Mmemme Ngabiga.
42 Mgbe o ruru afọ iri na abụọ, ha gara maka mmemme dị ka omenaala si dị.
43 Mgbe e mesịrị mmemme ahụ, ka ndị mụrụ ya na-alaghachi, nwata ahụ bụ Jisọs nọdụrụ na Jerusalem. Ndị ha amataghị na o soghị ha na-alọta.
44 Ha chere na o sonyere nʼetiti njem. Ha gara ije otu ụbọchị tupu ha a malite ịchọ ya nʼetiti ndị ikwu na ibe, na ndị enyi ha.
45 Ma mgbe ha na-ahụghị ya, ha laghachiri Jerusalem na-achọkwa ya.
Read Luke 2 in the app The whole chapter