The Bible › Baịbụlụ Nsọ › Luke 1
Ngọzị ga-adịrị onye ahụ kwere na Onyenwe anyị ga-emezu ihe o kweere ya na nkwa ime.”
Luke 1:45 · Baịbụlụ Nsọ
And blessed is she that believed: for there shall be a performance of those things which were told her from the Lord.
Blessed is she who has believed that the Lord’s word to her will be fulfilled.”
Blessed is she who believed, for there will be a fulfillment of the things which have been spoken to her from the Lord!”
Every translation above is public domain and free to share. Other versions — NIV · ESV · NKJV · NLT · NASB · CSB · AMP — are copyrighted and open on their publishers’ partner site.
42 O tiri mkpu nʼoke olu sị, “Onye a gọziri agọzi ka ị bụ nʼetiti ụmụ nwanyị niile. Onye a gọziri agọzi ka nwa ahụ ị bu nʼafọ bụkwa.
43 Onye kwanụ ka m bụ na ihuọma dị otu a kpọrọ m na nne Onyenwe m ga-abịa ileta m?
44 Ngwangwa m nụrụ olu ekele gị, nwa nọ m nʼafọ wuliri elu nʼọṅụ.
45 Ngọzị ga-adịrị onye ahụ kwere na Onyenwe anyị ga-emezu ihe o kweere ya na nkwa ime.”
46 Ma Meri sịrị, “Mkpụrụobi m na-ebuli Onyenwe anyị elu
47 mmụọ m na-aṅụrị ọṅụ nʼime Chineke bụ Onye nzọpụta m,
48 nʼihi na o ledatala anya, lekwasị m, bụ odibo ya dị ala. Site ugbu a gaa nʼihu, ọgbọ niile ga-akpọ m onye a gọziri agọzi.
Read Luke 1 in the app The whole chapter