The Bible › Baịbụlụ Nsọ › Leviticus 9
Nʼikpeazụ, o gburu ehi na ebule ahụ, nke bụ aja udo ndị Izrel. Ụmụ Erọn buteere ya ọbara nke o fesara gburugburu ebe ịchụ aja.
Leviticus 9:18 · Baịbụlụ Nsọ
← PreviousRead Leviticus 9Next →
He slew also the bullock and the ram for a sacrifice of peace offerings, which was for the people: and Aaron's sons presented unto him the blood, which he sprinkled upon the altar round about,
Then he slaughtered the ox and the ram as the people’s peace offering. His sons brought him the blood, and he sprinkled it on all sides of the altar.
He also killed the bull and the ram, the sacrifice of peace offerings, which was for the people. Aaron’s sons delivered to him the blood, which he sprinkled around on the altar;
Every translation above is public domain and free to share. Other versions — NIV · ESV · NKJV · NLT · NASB · CSB · AMP — are copyrighted and open on their publishers’ partner site.
15 Emesịa, Erọn wetara onyinye nke dị maka ndị mmadụ, o were ewu ahụ bụ maka mmehie ndị mmadụ, gbuo ya, were chụọ aja mmehie, dịka o mere nke mbụ.
16 Ọ chụkwara aja nsure ọkụ nʼusoro dịka iwu e nyere si dị.
17 O webatakwara aja mkpụrụ ọka ahụ, kporo nke juru ya aka, kpọọ ya ọkụ nʼelu ebe ịchụ aja, tinyekwara aja nsure ọkụ nke ụtụtụ ahụ.
18 Nʼikpeazụ, o gburu ehi na ebule ahụ, nke bụ aja udo ndị Izrel. Ụmụ Erọn buteere ya ọbara nke o fesara gburugburu ebe ịchụ aja.
19 Ọ chịkọtara abụba niile dị ehi na ebule ndị ahụ nʼahụ, na ọdụdụ ha, na abụba kpuchiri ihe ime ha, ya na akụrụ ha, na abụba kpuchiri umeju ha,
20 tụkwasị ha nʼobi anụ ndị ahụ, kpọọ ha ọkụ nʼebe ịchụ aja.
21 Mgbe ahụ, Erọn fufere, dịka onyinye mfufe, obi anụ ahụ, na apata aka nri ha nʼihu Onyenwe anyị dịka Mosis nyere nʼiwu.
Read Leviticus 9 in the app The whole chapter