The Bible › Baịbụlụ Nsọ › Leviticus 8

Leviticus 8:4

Mosis mere ihe Onyenwe anyị gwara ya ka o mee. Ọgbakọ ụmụ Izrel zukọtara nʼọnụ ụzọ ụlọ nzute ahụ.

Leviticus 8:4 · Baịbụlụ Nsọ

← PreviousRead Leviticus 8Next →

Leviticus 8:4 in other translations

KJV King James Version

And Moses did as the LORD commanded him; and the assembly was gathered together unto the door of the tabernacle of the congregation.

BSB Berean Standard Bible

So Moses did as the LORD had commanded him, and the assembly gathered at the entrance to the Tent of Meeting.

WEB World English Bible

Moses did as the LORD commanded him; and the congregation was assembled at the door of the Tent of Meeting.

Every translation above is public domain and free to share. Other versions — NIV · ESV · NKJV · NLT · NASB · CSB · AMP — are copyrighted and open on their publishers’ partner site.

In context

1 Onyenwe anyị gwara Mosis sị,

2 “Kpọta Erọn na ụmụ ya ndị ikom, chịtakwa uwe ha, weta mmanụ nsọ, oke ehi nke aja mmehie na ebule abụọ ahụ, na nkata achịcha a na-ejighị ihe na-eko achịcha mee.

3 Kpọkọtaa ọgbakọ ụmụ Izrel niile ka ha bịa nʼọnụ ụzọ ụlọ nzute.”

4 Mosis mere ihe Onyenwe anyị gwara ya ka o mee. Ọgbakọ ụmụ Izrel zukọtara nʼọnụ ụzọ ụlọ nzute ahụ.

5 Mosis gwara ọgbakọ ahụ sị, “Nke a bụ ihe Onyenwe anyị nyere nʼiwu ka e mee.”

6 Mgbe ahụ, Mosis kpọpụtara Erọn na ụmụ ya ndị ikom nʼihu, jiri mmiri saa ha ahụ.

7 O yikwasịrị Erọn uwe ime ahụ, kee ya ihe okike a na-eke nʼukwu, yikwasịkwa ya uwe mwụda na efọọd ahụ, jiri ihe okike ahụ a chọrọ mma kegidesie efọọd ahụ ike nʼahụ ya.

Read Leviticus 8 in the app The whole chapter

Search the Scriptures

Choose a translation

KJVBSBWEBNHEBASVYLTDBYWBTBBEEBRGNVDRALUTCANRIVLSGRVABPMYORIGBSWATGLIRV