The Bible › Baịbụlụ Nsọ › Leviticus 3

Leviticus 3:7

Ọ bụrụ onyinye atụrụ, onye ahụ ga-ewebata ya nʼihu Onyenwe anyị.

Leviticus 3:7 · Baịbụlụ Nsọ

← PreviousRead Leviticus 3Next →

Leviticus 3:7 in other translations

KJV King James Version

If he offer a lamb for his offering, then shall he offer it before the LORD.

BSB Berean Standard Bible

If he is presenting a lamb for his offering, he must present it before the LORD.

WEB World English Bible

If he offers a lamb for his offering, then he shall offer it before the LORD;

Every translation above is public domain and free to share. Other versions — NIV · ESV · NKJV · NLT · NASB · CSB · AMP — are copyrighted and open on their publishers’ partner site.

In context

4 akụrụ ya abụọ na abụba nke dị nʼelu ha ruo nʼakụkụ ukwu ya, na umeju ya na abụba kpuchiri umeju ya, nke ọ ga-ewepụ ya na akụrụ ya.

5 Mgbe ahụ, ụmụ Erọn ga-esunye ha ọkụ nʼelu aja nsure ọkụ a tụkwasịrị nʼosisi e sunyere ọkụ, ọ bụ onyinye nsure ọkụ, nke na-esi isi ụtọ nye Onyenwe anyị.

6 “ ‘Ọ bụrụ na onyinye aja udo a na-achụrụ Onyenwe anyị bụ site nʼigwe ewu maọbụ atụrụ, ọ ghaghị ịbụ mkpi maọbụ nne ewu na-enweghị ntụpọ.

7 Ọ bụrụ onyinye atụrụ, onye ahụ ga-ewebata ya nʼihu Onyenwe anyị.

8 Ọ ga-ebikwasị aka ya nʼisi atụrụ ahụ, gbuo ya nʼọnụ ụzọ ụlọ nzute. Ndị nchụaja, ụmụ Erọn, ga-efesa ọbara ya nʼakụkụ niile nke ebe ịchụ aja ahụ.

9 Ị ga-esite nʼonyinye aja udo a, weta onyinye nsure ọkụ nye Onyenwe anyị: abụba ya, na abụba niile dị nʼọdụdụ ya nke a ga-esite nʼakụkụ ọkpụkpụ azụ ya bepụta, na abụba kpuchiri ihe dị nʼime afọ ya; na abụba niile nke metụtara ha,

10 na akụrụ ya abụọ, na abụba kpuchiri ha ruo nʼakụkụ ukwu ya, na umeju ya, na abụba kpuchiri ya; nke ọ ga-ewepụ ya na akụrụ ya.

Read Leviticus 3 in the app The whole chapter

Search the Scriptures

Choose a translation

KJVBSBWEBNHEBASVYLTDBYWBTBBEEBRGNVDRALUTCANRIVLSGRVABPMYORIGBSWATGLIRV