The Bible › Baịbụlụ Nsọ › Leviticus 26
“ ‘Ọ bụrụkwa na mgbe nke a mesịrị, unu anọgidekwa jụ ime ihe m nyere nʼiwu, aga m eme ka ntaramahụhụ unu dịrị ukwuu, ugboro asaa ọzọ, nʼihi mmehie unu.
Leviticus 26:21 · Baịbụlụ Nsọ
← PreviousRead Leviticus 26Next →
And if ye walk contrary unto me, and will not hearken unto me; I will bring seven times more plagues upon you according to your sins.
If you walk in hostility toward Me and refuse to obey Me, I will multiply your plagues seven times, according to your sins.
“‘If you walk contrary to me, and won’t listen to me, then I will bring seven times more plagues on you according to your sins.
Every translation above is public domain and free to share. Other versions — NIV · ESV · NKJV · NLT · NASB · CSB · AMP — are copyrighted and open on their publishers’ partner site.
18 “ ‘Ọ bụrụ na unu anọgidesie ike ju ige m ntị nʼagbanyeghị ihe ndị a, aga m enye unu ntaramahụhụ dị okpukpu asaa nʼihi mmehie unu.
19 Aga m etiji ịnya isi nganga unu, mee ka mbara eluigwe dịịrị unu dịka igwe, elu ala unu na-azọkwasị ụkwụ ga-adịkwa dịka bronz.
20 Unu ga-adọgbu onwe unu nʼọrụ nʼefu, nʼihi na ala unu agaghị emepụtara unu ihe omume ya, osisi nke ala unu agaghị amịkwa mkpụrụ ya.
21 “ ‘Ọ bụrụkwa na mgbe nke a mesịrị, unu anọgidekwa jụ ime ihe m nyere nʼiwu, aga m eme ka ntaramahụhụ unu dịrị ukwuu, ugboro asaa ọzọ, nʼihi mmehie unu.
22 Aga m ezite anụ ọhịa megide unu. Ha ga-adọgbu ụmụ unu, bibie anụ ụlọ unu, meekwa ka unu dị nta nʼọnụọgụgụ, ruo na ndị a ga-ahụ nʼokporoụzọ unu ga-adị ole na ole.
23 “ ‘Ọ bụrụkwa na unu anọgide jụ ịdọ aka na ntị m, chie ntị nọgide na-ebu agha nnupu isi unu megide m,
24 mụ onwe m ga-ebu agha megide unu. Aga m eti unu ugbo ihe otiti asaa, nʼihi mmehie unu.
Read Leviticus 26 in the app The whole chapter