The Bible › Baịbụlụ Nsọ › Leviticus 25

Leviticus 25:49

Nwanne nne ya, maọbụ nwanne nna ya, maọbụ nwanna nʼikwu ha ọbụla nwere ike ịgbapụta ya. Ọ nwekwara ike ịgbapụta onwe ya ma ọ bụrụ na ọ kpata ego.

Leviticus 25:49 · Baịbụlụ Nsọ

← PreviousRead Leviticus 25Next →

Leviticus 25:49 in other translations

KJV King James Version

Either his uncle, or his uncle's son, may redeem him, or any that is nigh of kin unto him of his family may redeem him; or if he be able, he may redeem himself.

BSB Berean Standard Bible

either his uncle or cousin or any close relative from his clan may redeem him. Or if he prospers, he may redeem himself.

WEB World English Bible

or his uncle, or his uncle’s son, may redeem him, or any who is a close relative to him of his family may redeem him; or if he has grown rich, he may redeem himself.

Every translation above is public domain and free to share. Other versions — NIV · ESV · NKJV · NLT · NASB · CSB · AMP — are copyrighted and open on their publishers’ partner site.

In context

46 Unu nwere ike kenye ha ụmụ unu dịka ihe nketa, ma mee ha ndị ohu unu ụbọchị ndụ ha niile. Ma unu agaghị eji aka ike chịa onye Izrel ibe unu.

47 “ ‘Ọ bụrụ na onye ọbịa bi nʼetiti unu aghọọ ọgaranya, ma otu nʼime ụmụnna unu adaa ogbenye were onwe ya resi onye ọbịa ahụ bi nʼetiti unu, maọbụ were onwe ya resi nwanna ndị ikwu onye ọbịa ahụ,

48 ha nwere ikike ịgbapụta ya mgbe ha resiri onwe ha. Otu nʼime ụmụnna ya nwere ike gbapụta ha.

49 Nwanne nne ya, maọbụ nwanne nna ya, maọbụ nwanna nʼikwu ha ọbụla nwere ike ịgbapụta ya. Ọ nwekwara ike ịgbapụta onwe ya ma ọ bụrụ na ọ kpata ego.

50 Ya na onye ahụ o resiri onwe ya ga-agụ afọ ole ọ bụ site na mgbe o rere onwe ya ruo nʼafọ inwere onwe. Ego a ga-akwụ nʼihi ịgbapụta ya ga-abụ ego ọ ga-efu ịkwụ ohu ọzọ ụgwọ ịrụ ọrụ ọnụọgụgụ afọ ndị ahụ niile.

51 Ọ bụrụ nʼọtụtụ afọ fọdụrụ, ọ ga-esite nʼọnụ ego e rere ha kwụọ nke dị ukwu dịka ego mgbapụta ha. Naanị ihe ntakịrị ga-apụ nʼime ego ahụ.

52 Ọ bụrụ naanị afọ ole na ole fọdụrụ tupu afọ inwere onwe eruo, ọ ga-agụkọ ihe ego ahụ pụtara, kwụọ ya maka ịgbara onwe ya dịka o kwesiri.

Read Leviticus 25 in the app The whole chapter

Search the Scriptures

Choose a translation

KJVBSBWEBNHEBASVYLTDBYWBTBBEEBRGNVDRALUTCANRIVLSGRVABPMYORIGBSWATGLIRV