The Bible › Baịbụlụ Nsọ › Leviticus 22
Ma nwa nwanyị onye nchụaja nke di ya nwụrụ, maọbụ na ya na di ya ebikwaghị, ọ bụrụkwa na ọ mụtaghị nwa ọbụla, ọ lọghachi bịa biri nʼụlọ nna ya dịka o mere mgbe ọ bụ agbọghọ, o nwere ike iri nri dị nʼụlọ nna ya. Ọ dịkwaghị onye na-ekwesighị iri ya, nke ga-eri ya.
Leviticus 22:13 · Baịbụlụ Nsọ
← PreviousRead Leviticus 22Next →
But if the priest's daughter be a widow, or divorced, and have no child, and is returned unto her father's house, as in her youth, she shall eat of her father's meat: but there shall no stranger eat thereof.
But if a priest’s daughter with no children becomes widowed or divorced and returns to her father’s house, she may share her father’s food as in her youth. But no outsider may share it.
But if a priest’s daughter is a widow, or divorced, and has no child, and has returned to her father’s house as in her youth, she may eat of her father’s bread; but no stranger shall eat any of it.
Every translation above is public domain and free to share. Other versions — NIV · ESV · NKJV · NLT · NASB · CSB · AMP — are copyrighted and open on their publishers’ partner site.
10 “ ‘O nweghị onye ọbụla na-esiteghị nʼezinaụlọ ndị nchụaja ga-eri aja nsọ ahụ. Onye bụ ọbịa na onye e goro ọrụ nọ nʼụlọ onye nchụaja agaghị eri ya.
11 Otu ọ dị, ọ bụrụ na onye nchụaja weere ego nke aka ya gbata ohu, maọbụ na a mụrụ ohu ahụ nʼụlọ ya, ohu ahụ nwere ike iri aja nsọ ahụ.
12 Ọ bụrụ na nwa nwanyị onye nchụaja alụọ onye na-abụghị onye nchụaja, ọ gaghị eri ihe ọbụla site nʼime aja nsọ a.
13 Ma nwa nwanyị onye nchụaja nke di ya nwụrụ, maọbụ na ya na di ya ebikwaghị, ọ bụrụkwa na ọ mụtaghị nwa ọbụla, ọ lọghachi bịa biri nʼụlọ nna ya dịka o mere mgbe ọ bụ agbọghọ, o nwere ike iri nri dị nʼụlọ nna ya. Ọ dịkwaghị onye na-ekwesighị iri ya, nke ga-eri ya.
14 “ ‘Ọ bụrụ na onye ọbụla erie onyinye nsọ ahụ na-amaghị ama, ọ ga-eweghachiri onye nchụaja ihe niile o riri tụkwasịkwa ya otu ụzọ nʼụzọ ise ọzọ.
15 Ndị nchụaja ekwesighị imerụ onyinye nsọ ụmụ Izrel na-eche nʼihu Onyenwe anyị,
16 site nʼikwenye ka ndị mmadụ efu rie onyinye nsọ ahụ, si otu a wetara ndị riri ya ikpe ọmụma nke ya na nkwụghachi so. Abụ m Onyenwe anyị onye na-edo ha nsọ.’ ”
Read Leviticus 22 in the app The whole chapter