The Bible › Baịbụlụ Nsọ › Leviticus 14
“Ndị a bụ usoro iwu gbasara onye ọrịa ekpenta nʼoge a na-eme mmemme ịdị ọcha ya, mgbe e dutere ya bịakwute onye nchụaja.
Leviticus 14:2 · Baịbụlụ Nsọ
← PreviousRead Leviticus 14Next →
This shall be the law of the leper in the day of his cleansing: He shall be brought unto the priest:
“This is the law for the one afflicted with a skin disease on the day of his cleansing, when he is brought to the priest.
“This shall be the law of the leper in the day of his cleansing: He shall be brought to the priest,
Every translation above is public domain and free to share. Other versions — NIV · ESV · NKJV · NLT · NASB · CSB · AMP — are copyrighted and open on their publishers’ partner site.
1 Onyenwe anyị gwara Mosis, sị,
2 “Ndị a bụ usoro iwu gbasara onye ọrịa ekpenta nʼoge a na-eme mmemme ịdị ọcha ya, mgbe e dutere ya bịakwute onye nchụaja.
3 Onye nchụaja ga-apụ gaa nʼazụ ebe obibi nọdụ nʼebe ahụ lee ya ahụ, ịchọpụta ma ọrịa ekpenta ya ọ laala nʼezie. Ọ bụrụ na ọrịa ya alaala,
4 onye nchụaja ga-enye iwu ka e weta nnụnụ abụọ dị ndụ, na ụfọdụ osisi sida, na eriri ogho uhie, na hisọp, maka onye ahụ a ga-emere mmemme ịdị ọcha.
5 Onye nchụaja ga-enye iwu ka e gbuo otu nʼime nnụnụ abụọ ahụ nʼelu mmiri e si nʼọdọ mmiri na-asọ asọ kute nke dị nʼime ite aja.
Read Leviticus 14 in the app The whole chapter