The Bible › Baịbụlụ Nsọ › Leviticus 13
maọbụ nʼakpụkpọ anụ ọbụla, maọbụ nʼihe ọbụla e ji akpụkpọ ajị anụ maọbụ uwe ogho ọcha, uwe a kpara akpa, maọbụ nke a tụrụ atụ mee.
Leviticus 13:48 · Baịbụlụ Nsọ
← PreviousRead Leviticus 13Next →
Whether it be in the warp, or woof; of linen, or of woollen; whether in a skin, or in any thing made of skin;
any weave or knit of linen or wool, or any article of leather—
whether it is in warp or woof; of linen or of wool; whether in leather, or in anything made of leather;
Every translation above is public domain and free to share. Other versions — NIV · ESV · NKJV · NLT · NASB · CSB · AMP — are copyrighted and open on their publishers’ partner site.
45 “Onye ọbụla a chọpụtara na ọ bụ onye ekpenta ga-eyi uwe dọkara adọka, hapụ agịrị isi ya ka ọ dịka nke onye ara. Ọ ga-ekpuchi elu egbugbere ọnụ ya, na-eti mkpu na-asị, ‘Onye rụrụ arụ ka m bụ. Onye rụrụ arụ ka m bụ!’
46 Ụbọchị niile nke ọ nọ nʼọrịa ahụ, ọ gaghị ebi nʼime obodo nʼetiti ụmụ mmadụ nʼihi na onye rụrụ arụ ka ọ bụ.
47 “Ọ bụrụ na a hụrụ ntụpọ yiri ntụpọ ọrịa na-efe efe nʼuwe ajị anụ maọbụ nʼuwe ogho ọcha,
48 maọbụ nʼakpụkpọ anụ ọbụla, maọbụ nʼihe ọbụla e ji akpụkpọ ajị anụ maọbụ uwe ogho ọcha, uwe a kpara akpa, maọbụ nke a tụrụ atụ mee.
49 Ọ bụrụkwa na ntụpọ dị nʼuwe ahụ, maọbụ nʼakpụkpọ anụ ahụ, maọbụ nke a kpara akpa, maọbụ nke atụrụ atụ, maọbụ nʼihe akpụkpọ anụ ọbụla na-acha ahịhịa ndụ maọbụ uhie uhie, o nwere ike ịbụ ọrịa na-efe efe. A ga-ewegara onye nchụaja uwe ahụ ka o lezie ya anya.
50 Onye nchụaja ga-ele ya anya, were ya debe ya iche ụbọchị asaa.
51 Nʼụbọchị nke asaa, onye nchụaja ga-ele ya anya ọzọ. Ọ bụrụ na ntụpọ ahụ agbasaa nʼuwe ahụ maọbụ nʼihe ahụ a kpara akpa, maọbụ nʼihe ahụ a tụrụ atụ, maọbụ nʼihe akpụkpọ anụ ahụ, nʼime ụbọchị asaa ndị a, nʼagbanyeghị ihe e ji ha eme, ọ bụ ọrịa ọjọọ na-efe efe. Ihe ahụ bụ ihe rụrụ arụ.
Read Leviticus 13 in the app The whole chapter