The Bible › Baịbụlụ Nsọ › Leviticus 13

Leviticus 13:2

“Mgbe mmadụ hụrụ etuto, maọbụ ọnya, maọbụ ntụpọ na-eko eko nʼakpụkpọ anụ ahụ ya nke dị ka ihe ọrịa ekpenta na-eweta, a ga-eduru onye ahụ bịa nʼihu Erọn onye nchụaja maọbụ ụmụ ya ndị ikom, bụ ndị nchụaja.

Leviticus 13:2 · Baịbụlụ Nsọ

← PreviousRead Leviticus 13Next →

Leviticus 13:2 in other translations

KJV King James Version

When a man shall have in the skin of his flesh a rising, a scab, or bright spot, and it be in the skin of his flesh like the plague of leprosy; then he shall be brought unto Aaron the priest, or unto one of his sons the priests:

BSB Berean Standard Bible

“When someone has a swelling or rash or bright spot on his skin that could become an infectious skin disease, he must be brought to Aaron the priest or to one of his sons who is a priest.

WEB World English Bible

“When a man shall have a swelling in his body’s skin, or a scab, or a bright spot, and it becomes in the skin of his body the plague of leprosy, then he shall be brought to Aaron the priest or to one of his sons, the priests.

Every translation above is public domain and free to share. Other versions — NIV · ESV · NKJV · NLT · NASB · CSB · AMP — are copyrighted and open on their publishers’ partner site.

In context

1 Onyenwe anyị gwara Mosis na Erọn okwu sị ha,

2 “Mgbe mmadụ hụrụ etuto, maọbụ ọnya, maọbụ ntụpọ na-eko eko nʼakpụkpọ anụ ahụ ya nke dị ka ihe ọrịa ekpenta na-eweta, a ga-eduru onye ahụ bịa nʼihu Erọn onye nchụaja maọbụ ụmụ ya ndị ikom, bụ ndị nchụaja.

3 Onye nchụaja ga-eleru ọrịa ahụ dị ya nʼahụ anya. Ọ bụrụ na ajị dị gburugburu ebe ahụ ebidola ịcha ọcha, ọ bụrụkwa na ebe ahụ mibara ime, ọ bụ ọrịa ekpenta. Mgbe onye nchụaja leruchara ya anya, ọ ga-ekwupụta na onye ahụ bụ onye rụrụ arụ.

4 Ọ bụrụkwanụ na ajị dị gburugburu ebe ahụ dị ọcha, ma na ebe ahụ emighị emi karịa akụkụ ahụ ya ndị ọzọ, onye nchụaja ga-edebe onye ahụ ebe ọ ga-anọ naanị ya abalị asaa.

5 Mgbe ụbọchị asaa gasịrị, onye nchụaja ga-ele ya ahụ ọzọ. Ọ bụrụ na ọnya ahụ alabeghị, na ọ nwekwaghị mgbanwe ọbụla, a ga-edebekwa ya abalị asaa ọzọ.

Read Leviticus 13 in the app The whole chapter

Search the Scriptures

Choose a translation

KJVBSBWEBNHEBASVYLTDBYWBTBBEEBRGNVDRALUTCANRIVLSGRVABPMYORIGBSWATGLIRV