The Bible › Baịbụlụ Nsọ › Leviticus 11
na ọba mmiri, na ngwere aghụ, na ngwere, na ngwere uzuzu, na ogumagala.
Leviticus 11:30 · Baịbụlụ Nsọ
← PreviousRead Leviticus 11Next →
And the ferret, and the chameleon, and the lizard, and the snail, and the mole.
the gecko, the monitor lizard, the common lizard, the skink, and the chameleon.
the gecko, and the monitor lizard, the wall lizard, the skink, and the chameleon.
Every translation above is public domain and free to share. Other versions — NIV · ESV · NKJV · NLT · NASB · CSB · AMP — are copyrighted and open on their publishers’ partner site.
27 Nʼime anụmanụ niile na-aga ije nʼụkwụ anọ, anụmanụ ọbụla na-aga ije nʼọbụaka ya rụrụ arụ, unu agaghị eri ya. Onye ọbụla metụrụ ozu ya aka ga-abụ onye rụrụ arụ ruo uhuruchi.
28 Onye ọbụla ga-ebu ozu ya ga-asa uwe ya, bụrụkwa onye rụrụ arụ ruo uhuruchi, nʼihi na ọ bụ ihe rụrụ arụ nʼebe unu nọ.
29 “ ‘Nʼime anụmanụ niile na-enupụta enupụta nʼala, anụmanụ ndị a bụ ndị rụrụ arụ: nkapi, na oke, na agụ iyi dịka ụdị ha si dị,
30 na ọba mmiri, na ngwere aghụ, na ngwere, na ngwere uzuzu, na ogumagala.
31 Nʼime ihe niile na-enupụta enupụta nʼala ndị a rụrụ arụ nʼebe unu nọ. Onye metụrụ ozu ha aka ga-abụ onye rụrụ arụ tutu ruo uhuruchi ụbọchị ahụ.
32 Ihe ọbụla nke ozu ha dakwasịrị ga-abụ ihe rụrụ arụ, maọbụ osisi, maọbụ akwa, maọbụ akpụkpọ a na-akwa nʼala, maọbụ akpa, ihe ọbụla nke eji ya eme. A ga-etinye ya na mmiri, ọ ga-adịgide nʼime mmiri tutu ruo uhuruchi, mgbe ahụ ka ọ ga-adị ọcha.
33 Ọ bụrụ na otu nʼime ihe ndị a adanye nʼite aja, a ga-etiwa ite ahụ. Ihe niile dị nʼite ahụ abụrụla ihe rụrụ arụ.
Read Leviticus 11 in the app The whole chapter