The Bible › Baịbụlụ Nsọ › Leviticus 10
Mosis tụgharịrị sị Erọn na ụmụ ya, Elieza na Itama, “Unu ekwekwala ka ntutu isi unu kpasaa akpasa izipụta na unu na-eru ụjụ. Unu adọwakwala uwe unu. Nʼihi na ọ bụrụ na unu emee otu a, unu ga-anwụ. Iwe Onyenwe anyị ga-abịakwasịkwa ọgbakọ Izrel niile. Ma ndị ikwu gị, ụmụ Izrel ndị ọzọ, nwere ike ruo ụjụ nʼihi Nadab na Abihu.
Leviticus 10:6 · Baịbụlụ Nsọ
← PreviousRead Leviticus 10Next →
And Moses said unto Aaron, and unto Eleazar and unto Ithamar, his sons, Uncover not your heads, neither rend your clothes; lest ye die, and lest wrath come upon all the people: but let your brethren, the whole house of Israel, bewail the burning which the LORD hath kindled.
Then Moses said to Aaron and his sons Eleazar and Ithamar, “Do not let your hair become disheveled and do not tear your garments, or else you will die, and the LORD will be angry with the whole congregation. But your brothers, the whole house of Israel, may mourn on account of the fire that the LORD has ignited.
Moses said to Aaron, and to Eleazar and to Ithamar, his sons, “Don’t let the hair of your heads go loose, and don’t tear your clothes, so that you don’t die, and so that he will not be angry with all the congregation; but let your brothers, the whole house of Israel, bewail the burning which the LORD has kindled.
Every translation above is public domain and free to share. Other versions — NIV · ESV · NKJV · NLT · NASB · CSB · AMP — are copyrighted and open on their publishers’ partner site.
3 Mgbe ahụ, Mosis gwara Erọn sị, “Nke a bụ ihe Onyenwe anyị bu nʼobi mgbe o kwuru sị, “ ‘Nʼetiti ndị niile na-abịaru m nso ka a ga-edo m nsọ ọ bụkwa nʼihu ọha mmadụ, ka a ga-asọpụrụ m.’ ” Ma Erọn gbara nkịtị.
4 Mgbe ahụ, Mosis kpọrọ Mishael na Elzafan, ụmụ Uziel, nwanne nna Erọn sị ha, “Bịanụ nso. Gaanụ buputa ozu ụmụnne unu site nʼihu ebe nsọ, buru ha gaa nʼazụ ebe obibi.”
5 Ha bịara ghanye aka nʼuwe ime ahụ ha buru ha bupụ nʼazụ ọmụma ụlọ ikwu, dịka Mosis nyere nʼiwu.
6 Mosis tụgharịrị sị Erọn na ụmụ ya, Elieza na Itama, “Unu ekwekwala ka ntutu isi unu kpasaa akpasa izipụta na unu na-eru ụjụ. Unu adọwakwala uwe unu. Nʼihi na ọ bụrụ na unu emee otu a, unu ga-anwụ. Iwe Onyenwe anyị ga-abịakwasịkwa ọgbakọ Izrel niile. Ma ndị ikwu gị, ụmụ Izrel ndị ọzọ, nwere ike ruo ụjụ nʼihi Nadab na Abihu.
7 Ọzọ, unu ahapụla ọnụ ụzọ ụlọ nzute, ka unu ghara ịnwụ, nʼihi na mmanụ nsọ nke Onyenwe anyị dị nʼahụ unu.” Ha mere dịka Mosis gwara ha.
8 Mgbe ahụ, Onyenwe anyị gwara Erọn sị,
9 “Gị na ụmụ gị ndị ikom agaghị aṅụ mmanya, maọbụ ihe ọṅụṅụ ọbụla na-aba nʼanya mgbe unu na-aba nʼụlọ nzute ka unu ghara ịnwụ. Agbụrụ unu niile ga-esogide iwu a ruo ọgbọ niile na-abịa.
Read Leviticus 10 in the app The whole chapter