The Bible › Baịbụlụ Nsọ › Lamentations 2

Lamentations 2:9

Ọnụ ụzọ ama ya niile emikpuola nʼala; ọ gbajiela mkpọrọ niile e ji akpọchi ha, laakwa ha nʼiyi. A dọtala eze ya na ụmụ eze ya nʼagha, buru ha jee mba ọzọ. Iwu adịghịkwa, otu a, ndị amụma ya enwekwaghị ike ịhụ ọhụ site nʼebe Onyenwe anyị nọ.

Lamentations 2:9 · Baịbụlụ Nsọ

← PreviousRead Lamentations 2Next →

Lamentations 2:9 in other translations

KJV King James Version

Her gates are sunk into the ground; he hath destroyed and broken her bars: her king and her princes are among the Gentiles: the law is no more; her prophets also find no vision from the LORD.

BSB Berean Standard Bible

Her gates have sunk into the ground; He has destroyed and shattered their bars. Her king and her princes are exiled among the nations, the law is no more, and even her prophets find no vision from the LORD.

WEB World English Bible

Her gates have sunk into the ground. He has destroyed and broken her bars. Her king and her princes are among the nations where the law is not. Yes, her prophets find no vision from the LORD.

Every translation above is public domain and free to share. Other versions — NIV · ESV · NKJV · NLT · NASB · CSB · AMP — are copyrighted and open on their publishers’ partner site.

In context

6 O meela ka ebe obibi ya tọgbọrọ nʼefu, dịka ubi a gbara ogige; o bibiela ebe nzukọ ya niile. Onyenwe anyị emeela ka Zayọn chezọọ ime mmemme ya a kara aka, na idebe ụbọchị izuike ọbụla nsọ. Site nʼoke iwe ya, ọ jụla eze na onye nchụaja.

7 Onyenwe anyị ajụla ebe ịchụ aja ya gbakụta ebe nsọ ya azụ. O werela mgbidi niile nke ụlọeze ya nyefee nʼaka onye iro; ha emeela ka olu ha daa ụda nʼime ụlọ Onyenwe anyị dịka nʼụbọchị mmemme a kara aka.

8 Onyenwe anyị ekpebiela ibibi mgbidi gbara ada Zayọn gburugburu. O setịpụrụ ihe ọtụtụ; o sepụkwaghị aka ya na ibibi ya. O mere ka mkputamkpu aja na mgbidi ruo ụjụ, meekwa ka ha richapụsịa.

9 Ọnụ ụzọ ama ya niile emikpuola nʼala; ọ gbajiela mkpọrọ niile e ji akpọchi ha, laakwa ha nʼiyi. A dọtala eze ya na ụmụ eze ya nʼagha, buru ha jee mba ọzọ. Iwu adịghịkwa, otu a, ndị amụma ya enwekwaghị ike ịhụ ọhụ site nʼebe Onyenwe anyị nọ.

10 Ndị okenye ada Zayọn nọ ọdụ nʼala, dere duu. Ha ekpokwasịla aja nʼisi ha; ha eyikwasịkwala onwe ha uwe mkpe. Ụmụ agbọghọ Jerusalem na-amaghị nwoke ehulatala isi ha nʼala.

11 Ike agwụla anya m nʼihi ịkwa akwa, ime ime ahụ m na-anụ ọkụ. Obi m dị ka ihe a wụpụrụ nʼala, nʼihi na e bibiela ndị m, nʼihi na ụmụntakịrị na ụmụ a mụrụ ọhụrụ na-ada mba nʼokporoụzọ nke obodo.

12 Ha na-ebere nne ha akwa na-asị, “Olee ebe ọka na mmanya dị?” Mgbe ha na-ada mba dịka ndị e merụrụ ahụ nʼokporoụzọ obodo, mgbe ọnwụ ji nwayọọ na-eripịasị ndụ ha nʼaka nne ha ku ha.

Read Lamentations 2 in the app The whole chapter

Search the Scriptures

Choose a translation

KJVBSBWEBNHEBASVYLTDBYWBTBBEEBRGNVDRALUTCANRIVLSGRVABPMYORIGBSWATGLIRV