The Bible › Baịbụlụ Nsọ › Lamentations 2
“Lee anya, Onyenwe anyị, ma tụgharịa uche gị. Onye ka i sirila otu a mesoo mmeso? O kwesiri ka ndị bụ nne rie ụmụ ha, bụ ụmụ nke ha mụrụ? O kwesiri ka e gbuo onye nchụaja na onye amụma nʼime ebe dị nsọ nke Onyenwe anyị?
Lamentations 2:20 · Baịbụlụ Nsọ
← PreviousRead Lamentations 2Next →
Behold, O LORD, and consider to whom thou hast done this. Shall the women eat their fruit, and children of a span long? shall the priest and the prophet be slain in the sanctuary of the Lord?
Look, O LORD, and consider: Whom have You ever treated like this? Should women eat their offspring, the infants they have nurtured? Should priests and prophets be killed in the sanctuary of the Lord?
“Look, LORD, and see to whom you have done thus! Should the women eat their offspring, the children that they held and bounced on their knees? Should the priest and the prophet be killed in the sanctuary of the Lord?
Every translation above is public domain and free to share. Other versions — NIV · ESV · NKJV · NLT · NASB · CSB · AMP — are copyrighted and open on their publishers’ partner site.
17 Onyenwe anyị emeela ihe o zubere ime. O mezuola ihe o kwuru na ọ ghaghị ime site nʼoge gara aga. Ọ kwatuola gị, na-enweghị ọmịiko ọbụla. O meela ka ndị iro gị ṅụrịa ọṅụ nʼahụ gị; o meekwala ka e bulie ike nke ndị iro gị.
18 Obi ndị mmadụ na-etiku Onyenwe anyị. Gị, mgbidi niile nke ada Zayọn, ka anya mmiri gị na-asọpụta dịka osimiri ehihie na abalị niile, enyekwala onwe gị izuike, enyekwala anya gị izuike.
19 Bilie, kwaa akwa nʼabalị, nʼoge mmalite nche abalị. Wụpụta ihe dị gị nʼobi nʼihu Onyenwe anyị dịka ọ bụ mmiri. Welie aka unu elu nye Onyenwe anyị nʼihi ụmụntakịrị ndị a, ndị na-ada nʼihi agụụ nʼisi okporoụzọ niile.
20 “Lee anya, Onyenwe anyị, ma tụgharịa uche gị. Onye ka i sirila otu a mesoo mmeso? O kwesiri ka ndị bụ nne rie ụmụ ha, bụ ụmụ nke ha mụrụ? O kwesiri ka e gbuo onye nchụaja na onye amụma nʼime ebe dị nsọ nke Onyenwe anyị?
21 “Ụmụ okorobịa na ndị okenye dinakọrọ nʼotu ebe, nʼuzuzu nke okporoụzọ. E jirila mma agha gbuo ụmụ okorobịa m na ụmụ agbọghọ m. I gbuola ha nʼụbọchị iwe gị; i gburu ha jụ inwe ọmịiko nʼahụ ha.
22 “Dịka i si akpọ oku ka a bịa nʼụbọchị oriri, otu a ka i si kpọkọta ihe egwu niile ka ha bịakwasị m nʼakụkụ niile. Nʼụbọchị nke iwe Onyenwe anyị ọ dịghị onye gbapụrụ ọsọ, ọ dịkwaghị onye fọdụrụ ndụ; ndị m lekọtara, zụlitekwa ka ndị iro m lara nʼiyi.”
Read Lamentations 2 in the app The whole chapter