The Bible › Baịbụlụ Nsọ › Judges 7

Judges 7:2

Mgbe ahụ, Onyenwe anyị gwara Gidiọn okwu sị ya, “Lee, ndị ikom gị dị ọtụtụ. Agaghị m enyefe ndị Midia nʼaka ha, ma ọ bụghị otu a, Izrel ga-anya isi megide m, sị, ‘Ike aka m azọpụtala m.’

Judges 7:2 · Baịbụlụ Nsọ

← PreviousRead Judges 7Next →

Judges 7:2 in other translations

KJV King James Version

And the LORD said unto Gideon, The people that are with thee are too many for me to give the Midianites into their hands, lest Israel vaunt themselves against me, saying, Mine own hand hath saved me.

BSB Berean Standard Bible

Then the LORD said to Gideon, “You have too many people for Me to deliver Midian into their hands, lest Israel glorify themselves over Me, saying, ‘My own hand has saved me.’

WEB World English Bible

The LORD said to Gideon, “The people who are with you are too many for me to give the Midianites into their hand, lest Israel brag against me, saying, ‘My own hand has saved me.’

Every translation above is public domain and free to share. Other versions — NIV · ESV · NKJV · NLT · NASB · CSB · AMP — are copyrighted and open on their publishers’ partner site.

In context

1 Jerub-Baal, onye bụkwa Gidiọn, na ndị agha ya niile biliri nʼisi ụtụtụ, maa ụlọ ikwu ha nʼisi iyi Harod. Ma ndị agha Midia mara ụlọ ikwu nke ha nʼakụkụ ugwu ebe ndị Izrel nọ, nʼime ndagwurugwu nke dị nso nʼugwu nta More.

2 Mgbe ahụ, Onyenwe anyị gwara Gidiọn okwu sị ya, “Lee, ndị ikom gị dị ọtụtụ. Agaghị m enyefe ndị Midia nʼaka ha, ma ọ bụghị otu a, Izrel ga-anya isi megide m, sị, ‘Ike aka m azọpụtala m.’

3 Ugbu a, maa ọkwa nye ndị agha sị ha, ‘Onye ọbụla ụjọ na-atụ, ya hapụ ugwu Gilead laghachi azụ.’ ” Nʼihi nke a, iri puku ndị agha abụọ na abụọ laghachiri azụ nʼụlọ nke aka ha. Ma ndị agha dị puku iri nʼọnụọgụgụ fọdụrụ.

4 Ma Onyenwe anyị gwara Gidiọn, sị ya, “Lee, ndị agha gị ka dị ọtụtụ. Duru ha gbada na mmiri ala, m ga-anwale ha ma webilatara gị ọnụọgụgụ ha nʼebe ahụ. Ọ bụrụ na m sị, ‘Onye nke a ga-eso gị jee,’ ọ ga-eje, ma ọ bụrụ na m sị, ‘Onye nke a agaghị eso gị jee,’ ọ gaghị eso jee.”

5 Ya mere, Gidiọn duuru ha bịa na mmiri ala ahụ. Nʼebe ahụ, Onyenwe anyị gwara ya okwu sị ya, “Kewapụ ndị ji ire ha rachara mmiri dịka nkịta, site na ndị ahụ gburu ikpere nʼala ịṅụ mmiri.”

Read Judges 7 in the app The whole chapter

Search the Scriptures

Choose a translation

KJVBSBWEBNHEBASVYLTDBYWBTBBEEBRGNVDRALUTCANRIVLSGRVABPMYORIGBSWATGLIRV