The Bible › Baịbụlụ Nsọ › Judges 20
ma mgbe ahụ, ndị Izrel ga-ebido ịbọ ọbọ ogbugbu egburu ha. Ndị Benjamin egbuolarị iri ndị Izrel atọ, nʼihi ya ha sịrị, “Anyị na-emeri ha dịka anyị mere nʼagha mbụ.”
Judges 20:39 · Baịbụlụ Nsọ
← PreviousRead Judges 20Next →
And when the men of Israel retired in the battle, Benjamin began to smite and kill of the men of Israel about thirty persons: for they said, Surely they are smitten down before us, as in the first battle.
the men of Israel would turn in the battle. When the Benjamites had begun to strike them down, killing about thirty men of Israel, they said, “They are defeated before us as in the first battle.”
The men of Israel turned in the battle, and Benjamin began to strike and kill of the men of Israel about thirty persons; for they said, “Surely they are struck down before us, as in the first battle.”
Every translation above is public domain and free to share. Other versions — NIV · ESV · NKJV · NLT · NASB · CSB · AMP — are copyrighted and open on their publishers’ partner site.
36 Mgbe ahụ, ndị Benjamin nʼonwe ha, hụrụ na e emeriela ha. Ugbu a, ndị ikom Izrel nyere ndị Benjamin ohere ịga nʼihu, nʼihi na ha dabere na ndị ha zoro nʼọhịa nʼakụkụ Gibea.
37 Ndị ahụ zoro nʼọhịa gbapụtara ọsịịsọ gbaba nʼobodo Gibea, kesaa onwe ha, were mma agha gbuchapụ ndị niile nọ nʼobodo ahụ.
38 Ndị Izrel na ndị zoro nʼọhịa kwekọtara na ha ga-eme ka anwụrụ ọkụ dị ukwuu na-ala elu elu site nʼobodo ahụ,
39 ma mgbe ahụ, ndị Izrel ga-ebido ịbọ ọbọ ogbugbu egburu ha. Ndị Benjamin egbuolarị iri ndị Izrel atọ, nʼihi ya ha sịrị, “Anyị na-emeri ha dịka anyị mere nʼagha mbụ.”
40 Ma mgbe anwụrụ ọkụ malitere ịla elu site nʼobodo ahụ, ndị Benjamin lere anya nʼazụ hụ ka anwụrụ ọkụ na-ala elu site nʼakụkụ niile nke obodo ahụ.
41 Mgbe ahụ, ndị Izrel bidoro igbu ha, oke egwu jidere ndị Benjamin nʼihi na ha ghọtara na ịla nʼiyi adakwasịla ha.
42 Ha si nʼihu ndị Izrel gbaa ọsọ, gbaga nʼụzọ gawara nʼọzara, ma ha enweghị ike ịgbanarị agha ahụ. Ndị Izrel si nʼobodo Gibea gbapụta gburu ha nʼebe ahụ.
Read Judges 20 in the app The whole chapter