The Bible › Baịbụlụ Nsọ › Judges 13

Judges 13:14

Ka ọ ghara iri ihe ọbụla si nʼosisi vaịnị, maọbụ ṅụọ mmanya ọbụla maọbụ ihe ọbụla na-aba nʼanya, maọbụ rie ihe rụrụ arụ ọbụla.”

Judges 13:14 · Baịbụlụ Nsọ

← PreviousRead Judges 13Next →

Judges 13:14 in other translations

KJV King James Version

She may not eat of any thing that cometh of the vine, neither let her drink wine or strong drink, nor eat any unclean thing: all that I commanded her let her observe.

BSB Berean Standard Bible

She must not eat anything that comes from the vine, nor drink any wine or strong drink, nor eat anything unclean. She must do everything I have commanded her.”

WEB World English Bible

She may not eat of anything that comes of the vine, neither let her drink wine or strong drink, nor eat any unclean thing. Let her observe all that I commanded her.”

Every translation above is public domain and free to share. Other versions — NIV · ESV · NKJV · NLT · NASB · CSB · AMP — are copyrighted and open on their publishers’ partner site.

In context

11 Manoa biliri, soro nwunye ya. Mgbe o bịarutere ebe nwoke ahụ nọ, ọ jụrụ ya ajụjụ sị, “Ọ bụ gị bụ nwoke ahụ gwara nwunye m okwu nʼoge gara aga?” Ọ zara sị ya, “E, ọ bụ m.”

12 Manoa gwara ya okwu sị, “Mgbe okwu gị mezuru, gịnị bụ iwu banyere ndụ na ọrụ nwa nwoke a?”

13 Mmụọ ozi Onyenwe anyị zaghachiri, “Nwunye gị aghaghị imezu ihe niile m nke m gwara ya.

14 Ka ọ ghara iri ihe ọbụla si nʼosisi vaịnị, maọbụ ṅụọ mmanya ọbụla maọbụ ihe ọbụla na-aba nʼanya, maọbụ rie ihe rụrụ arụ ọbụla.”

15 Manoa rịọrọ Mmụọ ozi Onyenwe anyị si ya, “Ọ ga-amasị anyị ma ị nọdụ chere ka anyị kwadoro gị nwa ewu.”

16 Ma Mmụọ ozi Onyenwe anyị zara ya, “A sịkwarị na i mee ka m nọrọ, agaghị m eri nri gị ọbụla. Ma ọ bụrụ na i kwadoo aja nsure ọkụ, were ya chụọrọ Onyenwe anyị aja.” Ma Manoa aghọtaghị na onye ahụ bụ Mmụọ ozi Onyenwe anyị.

17 Mgbe ahụ, Manoa jụrụ Mmụọ ozi Onyenwe anyị ahụ, sị, “Biko, gịnị bụ aha gị, ka anyị nye gị nsọpụrụ dịịrị gị mgbe okwu gị mezuru?”

Read Judges 13 in the app The whole chapter

Search the Scriptures

Choose a translation

KJVBSBWEBNHEBASVYLTDBYWBTBBEEBRGNVDRALUTCANRIVLSGRVABPMYORIGBSWATGLIRV