The Bible › Baịbụlụ Nsọ › Joshua 4
Ndị agha ọnụọgụgụ ha ruru iri puku anọ (40,000), ndị jikeere nke ọma ibu agha, duuru ebo ndị ọzọ, gafere nʼihu Onyenwe anyị bata nʼobosara ala Jeriko maka ibu agha.
Joshua 4:13 · Baịbụlụ Nsọ
About forty thousand prepared for war passed over before the LORD unto battle, to the plains of Jericho.
About 40,000 troops armed for battle crossed over before the LORD into the plains of Jericho.
About forty thousand men, ready and armed for war, passed over before the LORD to battle, to the plains of Jericho.
Every translation above is public domain and free to share. Other versions — NIV · ESV · NKJV · NLT · NASB · CSB · AMP — are copyrighted and open on their publishers’ partner site.
10 Ndị nchụaja, ndị bụ igbe ọgbụgba ndụ ahụ, guzoro nʼetiti osimiri Jọdan, tutu ruo mgbe e mezuru iwu ahụ niile Onyenwe anyị nyere Joshua site nʼọnụ Mosis. Mgbe ahụ kwa, ndị Izrel mere ngwangwa gafee osimiri Jọdan.
11 Ngwangwa ha niile gafetasịrị, igbe ọgbụgba ndụ Onyenwe anyị na ndị nchụaja gafetakwara nʼakụkụ nke ọzọ, ka ndị mmadụ na-ele ha anya.
12 Ndị agha ụmụ Ruben, na ụmụ Gad, na ọkara ebo Manase, buuru ụmụ Izrel niile ụzọ gafee, idu ha nʼagha, dịka Mosis nyere ha nʼiwu.
13 Ndị agha ọnụọgụgụ ha ruru iri puku anọ (40,000), ndị jikeere nke ọma ibu agha, duuru ebo ndị ọzọ, gafere nʼihu Onyenwe anyị bata nʼobosara ala Jeriko maka ibu agha.
14 Ụbọchị ahụ bụ ụbọchị Onyenwe anyị buliri Joshua elu nke ukwuu nʼihi na o mere Joshua ka ọ dị ukwuu nʼanya ndị Izrel niile, si otu a mee ka ha tụọ ya egwu nke ukwuu dịka ha si tụọ Mosis egwu, ma sọpụkwara ya ụbọchị niile nke ndụ ya.
15 Mgbe ahụ, Onyenwe anyị gwara Joshua okwu sị,
16 “Nye ndị nchụaja, ndị bu igbe ọgbụgba ndụ ahụ iwu ka ha si nʼosimiri Jọdan pụta.”
Read Joshua 4 in the app The whole chapter